Etu idemmiri si kpaa mkpamkpa n'Anambara Steeti n'izu a

Ebe foto si, NPF
Ụzụ akwa ka na-ada ugbua n'Anambara steeti n'ihi mkpa mkpa idemmiri kpara n'ebe dị iche iche na steeti ahụ dịka nnukwu mmiri zoro n' ụbọchị Monde na Tuzde izu a.
A hụrụ ozu nwatakịrị a kpọrọ Success Ezenwafor bụ nwata ụlọakwụkwọ, ụbọchị Wenezde, dịka Meyọ Awka South bụ Chinedu Okafor,si gbaa n'ama n'ụbọchị Wenezde.
N'ozi o wepụtara, Okafor tiri ezinaụlọ Sucess aka n'obi ma kelee ndị ntorobịa Isiagu for bụ ndị o kwuru nyere aka ọsọ enyemaka n'oge ma kwuo na ndị a zọpụtara na-anata nleta ahụike n'ụlọọgwụ ugbua.
Idemmiri buuru ụgbọala bu Success, ụmụakwukwọ nakwa ndị ọzọ ala akwụkwọ ụbọchị Tuzde n'okporoụzọ 'Nibo–Isiagu Road' dị n' Awka,isiobodo Anambra steeti.

Ebe foto si, NPF
A zọpụtara mmadụ iri gụnyere ụmụakwụkwọ asatọ na ndị okenye abụọ,ebe a nọ na-achọbu Sucess ma mechaa hụ ozu ya.
N'ihe onyonyo na-awụ akpata oyi na-efesa na soshal midia gosiri oge ndị mmadụ gụnyere Meyo Awka- South bụ Chinedu Okafor gbatara ndị ọdachi ahụ dabidoro ọsọ enyemaka ma zọpụta ụfọdụ n'ime ha bụ ndị tọrọ n'ụgbọala ahụ mmiri chọrọ iri.

Ebe foto si, ABS
Otu n'ime ụmụaka ahụ bụ nwata nwoke a kpọrọ Success Ezenwafor ka mmiri ahụ buuru pụọ, e mechara gụpụta ozu nwata ahụ ebe mmiri rbuuru ya gaa na ụzọ Awka-Nibo-Enugwu Ukwu.
Ozi ndị Uweojii Anambara wepụtara kwuru na ọ bụ ụzọ Nibo-Ishiahu dị n' Awka ka idemmiri ahụ nọrọ buru ụgbọala ahụ.
Kọmishọna Nnanna Oji Ama gwara ndị nne na nna na ndị nwe ụlọakwụkwọ ka ha kee nkwụcha ghara idu ụmụaka gaa na akwa mmiri ma ọ bụ ụzọ idemmiri n'oge ugbua mmiri n'ezosikie.































