Fuel Scarcity: Lee etu ụkọ mmanụ ụgbọala si anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ

Aha onyonyo, Fuel Scarcity: Lee etu ụkọ mmanụ ụgbọala si anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ
Mgbe e biputara ya

Ụmụ Naịjirịa pụtara n'ụtụtụ Monde chọpụta na ahịrị ụgbọala amalitekwala ọzọ n'ebe dị icheiche.

Ihe ahụ gara n'ihu rue ụbọchị Tuusde a dịka BBC Igbo gara gbaa ọtụtụ mmadụ ajụjụ ọnụ.

Ndị na-akwọ ụgbọala na-ekwu na ebe niile tọgbọ chakoo, na o nweghizi ndị mmadụ ha hụrụ iburu.

Ebe ndị ọzọ na-ekwu na ụkọ emeela ka ọnụ ya bụ mmanụ ụgbọala rịa elu.

Ọdọ mmanụ ụgbọala

Bobby Eberechi Dick bụ onyeisioche ndị na-ere mmanụ ụgbọala tinyere ọnụ n'okwu a.

Ọ sị na NNPC bụ ndị ọ bụ naanị ha na-ebubata mmanụ agbịdị na-eresi ndị nkịtị mmanụ ahụ nke mere ọ ji dị oke ọnụ maka na ndị ahụ na-ere ya n'ọnụ ọbụla sọrọ ha.

Dick sị "ahụhụ ọzọ anyị na-agagbiga bụ na ụzọ e si aga ọdọ mmanụ agbịdị n'ọwụnwa anyanwụ emebichaala, ọ na-eme ka ụgbọala tanka anyị na-ada nke na-ebutere anyị ọghọm n'ahịa anyị na-azụ".

Nke a bụ ugboro abụọ a na-enwe ụkọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa n'afọ 2022.