You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị bụ 'Blessed Sacrament' e zuuru n'ụlọụka Katọlik dị n'Owere?
Archdiocese ụka Katọlik n'Owere agbanyela aka n'isi tie ebewu ma tie ololololooo gbasara sacrament dị ngọzi ndị ohi zuuru na St Mulumba Parish dị n'okporoụzọ Wetheral, oge mmiri na-ezo n'ụbọchị Wenezde 29 Eprel 2026.
Onye Chancellor nakwa Odeakwụkwọ Archdiocese Owere bụ Rev. Fr Patrick Mbarah kọwara na ndị kpara arụ ahụ kpakara gbamgbam ụlọụka ahụ iji banye na Chapel of Adoration, ma buru sacrament dị ngọzi rie mbọmbọ.
Archbishopụ na-elekọta Archdiocese ahụ bụ Most Rev. Lucius Ugorji enyela ntuziaka ka ndị na-efe ofufe na St Mulumba Parish bagide ekpere otu izuụka maka mgbaghara mmehie.
N'ụka Katọlik, Sacrament dị ngọzi pụtara anụ ahụ, ọbara, mmụọ na ihe dum mejupụtara Jizọs Kraịst, nke a na-echekwa n'ebe nchụaja maka ọjịjamma na mmekọ nke mmụọ nso. Ọ bụ nke a mere ha ji echekwa ya n'igbe a kpọchiri akpọchi ma mụnye oriọna n'akụkụ ya.
Ihe ndị a na-ejikarị akpụ sacrament dị ngọzi bụ ngwa ndị dara oke ọnụahịa dịka ọlaedo, ọlaọcha, nakwa ihe ndị na-amụke amụke iji gosipụta idi ukwuu nke emume oriri ngabiga Jizọs Kraịst.
Sacrament dị ngọzi nwere nsọ dị iche iche, nke gụnyere na ọ bụghị mmadụ niile na-emetụ ya aka, e wezuga ndị ụkọchukwu e tere mmanụ na ndị ụkọchukwu pụrụiche, bụ ndị na-eji akwa pụrụiche ebu ya. Mana ọ bụrụ n'ọnọdụ gbatagbata, ikekwe, sacrament dị nsọ daa n'ala, onye ọbụla bụ onye Katọlik nwereike bulie ya, mana, ọ ga-akpachapụrụ ya anya nke ọma.
Ọ bụrụ na e zuo sacrament dị ngọzi, a na-ahụta ya dịka arụ na mmetọ. Ndị ụka na-abanye n'ekpere mgbaghara mmehie ozugbo, ma mapụkwa onye zuru ya n'iwu, nke bụ ntaramaahụhụ a pụrụ ịkwụsị naanị site na Holy See.