Ọgwụ mgbochi na-azọ ndụ nwatakịrị ọbụla kwesịrị inweta

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

A bịa n'ụwa anyị nọ n'ime ya taa, ọgwụ mgbochi bụ otu n'ime ụzọ kachasị dị mkpa na nchekwa ndụ mmadụ, ọkachasị nke ụmụaka.

Ụlọọrụ ahụike mba ụwa bụ World Health Organisation (WHO), adọọla aka na ntị ma kwuo na ụmụaka na-erubeghị afọ ise kwesịrị ịnata ụfọdụ ọgwụ mgbochi dị mkpa iji gbochie ọrịa ndị nwereike ibutere ha nkwarụ maọbụ ọnwụ.

Mana gịnị bụ ọrịa ndị a na etu ha si emetụta ahụike ụmụaka?

Ọrịa ntụrịọkpa

Ọrịa ntụrịokpa bụ 'polio' n'asụsụ bekee, bu nje na-emetụta akwara nwatakiri.

Ọ nwereike ime ka aka maọbụ ụkwụ nwatakịrị kwụsị ịrụ ọrụ, mana n'ọnọdụ ụfọdụ, ọ na-ebute nkwarụ bekee kpọrọ 'disability' na ndụ nwatakirị ruo mgbe o toro buru okenye.

Ọ bụ eziokwu na e kpochapụrụ nje 'polio' na Naịjirịa na mpaghara ala Igbo n'afọ 2020, mana nke a apụtaghị ka anyị bido ịhị ụra maka nje nke bekee kpọrọ 'poliovirus type 2 (cVDPV2)' ka na-akpa ike n'ụfọdụ ebe na mpaghara ugwu Naịjirịa.

Akụkọ kwuru na nke a nwereike ịgbasa ma ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya ma chụọ ya ọsọ ụkwụ eru ala.

N'ihi nke a, ụlọọrụ WHO adọọla aka na ntị banyere mkpa ọ dị ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi iji mee ka Naịjirịa nọgide dịka mba nweerela onwe ya n'aka ọrịa ntụrịọkpa.

Ụzọ abụọ e si enye ọgwụ mgbochi ọrịa polio bụ site n'ịgba ya n'ahụ nakwa ịṅụ ya n'ọnụ.

Ọrịa Akpata

Ọrịa akpata ma ọ bụ arụbara a na-akpọ 'Measles' n'olu Bekee bụ ọrịa na-efegharị n'ikuku.

Ọ bụ ọrịa na-efe efe nke ukwuu ma na-ebute ahụ ntụkasị. Ọ na-amalite na ahụ ọkụ na ụkwara.

Ọ nwereike ibute oke oyi nke a na-akpọ 'pneumonia' n'olu Bekee, mgbakasị ahụ siri ike maọbụ ọnwụ.

Ụlọọrụ WHO kwuru na ọrịa a na-egbu ụmụaka na-erubeghi afọ ise ọnụọgụgụ ha dị narị atọ kwa ụbọchị n'ụwa niile.

Ọ bụkwa naanị ịgba ọgwụ mgbochi ga-echekwa ụmụaka pụọ n'ọrịa ọjọọ a.

Ọrịa ụkwara nta

Ụkwaranta nke Bekee na-akpọ 'tuberculosis' (TB), bụ ọrịa a na-emetụta akpa ume ma kpalite oke ụkwara.

O nwereike ibutere ụmaka oke ike ọgwụgwụ ma mee ka iku ume siere ha ike.

O nwekwara ike ibute ọnwụ ma ọ bụrụ na achọpụtaghị ma bido ọgwụgwọ ya n'oge.

Ọgwụ mgbochi a nke a na-akpọ BCG n'ịchafụ, bụ ọgwụ a na-enye ụmụaka ọhụrụ site n'ịgba ha ya n'ahụ iji gbochie ha ibute ọrịa ụkwara nta.

Ịba ọchananya

Nje Ịba ọchananya nke Bekee na-akpọ Hepatitis bụ ọrịa na-emetụta imeju 'liver'.

Ọ bụrụ na nwatakịrị bute ya, o nwereike ịkpata ọrịa imeju na-anọte aka, maọbụ ọrịa kansa imeju.

A na-agba ọgwụ mgbochi hepatitis site n'ịgba ya n'ime akwara nwatakịrị iji mee ka ahu ya nwee ikike ịlụso ọrịa ahụ ọgụ.

Ọrịa nkwechi akpịrị

Nkwechi akpịrị bụ 'diphtheria' na asụsụ Bekee bụ ọria na-ebute mkpọchi siri ike n'olu nke na-egbochi mmadụ iku ume.

Ọrịa a nwereike igbu nwatakịrị ngwa ngwa ma ọ bụrụ na e lebanyeghi ya anya.

Dọkịnta Cosmas Egwuatu, onyeisi ụlọọgwụ Alwell Medical Center, Aba, kọwara na ọ kacha mma ịmalite ịgba nwatakịrị ọhụrụ ọbụla ọgwụ mgbochi ngwangwa o ruru izu isii.

O kọwara na ọ dị mkpa ka ndị okenye na-anata ọgwụ nkwado a kwa afọ iri ọbụla iji gbochie ha ibute ya..

Dọkịnta Egwuatu kwukwara sị na "Ọgwụ a nwereike ọrụ pụrụ iche maka na ọ na-enye nwatakịrị nchebe karịrị pasentị iri itoolu na ise."

Ọrịa ndọji ekwu 'tetanus'

Ndọji ekwu nke a na-akpọ 'Tetanus' maọbụ 'lockjaw' n'asụsụ bekee, na-eme ka akwara sie ike nke ukwuu.

Nke a nwereike ime ka nwa ghara imepe ọnụ maọbụ iku ume nke ọma.

Ọgwụ mgbochi ya na-arụ ọrụ site n'iweta 'tetanus toxoid' iji zụọ ahụ mmadụ ka o nwee ike igbochi ọrịa a.

Nke a na-enyere aka chekwa ahụ mmadụ ma gbochie ya ibute ọrịa ahụ.

Ụkwara na-adigide adigide 'whooping cough'

Ụdị ụkwara a bụ nke a na-akpọ 'Pertussis' ma ọ bụ 'Whooping cough' n'asụsụ Bekee. Ọ bụ ụkwara siri ike nke na-egbochi nwa iku ume nke ọma, nke pụkwara ibute nnukwu nsogbu ahụike.

Dọkịta Laz Okoro, onye isi ụlọ ọgwụ Star Clinic, kọwara na nje ụkwara a na-efe efe ngwa ngwa site n'aka mmadụ gaa n'ibie. Ọ na-agbasasị n'ikuku ọkachasị mgbe onye bu ya kwara ụkwara n'ọha.

O kwukwara sị: "Ịgba ọgwụ mgbochi dị mkpa maka ụmụ ọhụrụ na ụmụaka na-erubeghị afọ asaa. Ọ dịkwa mma maka ndị nọ n'afọ iri, na ndị okenye, ọkachasị umuwanyị dị ime, iji hụ na e chebere ma nne ma nwa."

Ọrịa ngụ 'pneumonia'

Ụdị ọrịa ngụ a nke asụsụ Bekee na-akpọ 'Pneumonia' bụ otu n'ime ọrịa kacha egbu ụmụaka n'ụwa niile.

Dịka nnyocha nke otu mbaụwa na-ahụ maka ahụike (WHO) siri gosi, ọrịa a na-egbu ihe karịrị ụmụaka nde iri na isii (1.6 million) kwa afọ.

Dọkịta Okoro kọwara na ọrịa a na-awakpo akpa ume, nke na-eme ka iku ume siere nwatakịrị ike nke ukwuu. O kwuru sị:

"Ụzọ kacha mma isi gbochie ọrịa a bụ ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi. Ọ dịkwa mkpa ka anyị zere anwụrụ ọkụ ma na-edebe gburugburu anyị ọcha. Inye ụmụaka mmiri ara nne nke ọma na-enyekwara aka n'ịkwalite ahụ ike ha iji lụso ọrịa ọgụ.