Man United vs Burnley FC: A sụọla Manchester United ka ede ụrị na be ha

Phil Jones na David de Gea

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Otu egwuregwu Burnley asọghị anya ka ha ji ọkpụ goolu abụọ chara acha zọọ Manchester United aja n'Old Trafford.

Goolu Chris Wood nyere na nkeji 39 e ji bido bọọlụ na nke Jay Rodriguez nyere na nkeji 56 zuru imenye ndị Man Utd n'agbanyeghi na enweghi onye a chụpụrụ achụpụ.

Iwe mmeri a e meriri ha n'azụ ụlọ ha mere ka ndị na-akwado Man Utd malite ịkwa ha emu.

Ha kwogidere ha 'wooo!!' oge ha na-apụ n'ọgbọegwuregwu oge a gara ezumiike nkeji iri na ise a na-aga ma a gbachaa ọkara nke mbụ, ma kwokwaa ha ọzọ ka ha na-apụ mgbe a gbazuru bọọlụ.

Ha burukwara iwe ahụ gbadata na soshal midia ebe ha na-ekwu '#OleOut' nke bụ ịkpọ oku ka a chụpụ Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nchịkọta ha.

Ndị otu Burnley

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mmeri a emeela ka Burnley na Crystal Palace, Arsenal, Everton na Newcastle hara na pọịntị

Ihe bu mbụ Burnley na-emeri Man U n'ime ugboro 15 ha na-ezute. Ọ bụ n'afọ 1962 ka ha meriri Man U. Ọ bụ ọkpụ goolu ise asatara abụọ ka ha gbara n'oge ahụ.

Marcus Rashford bụ onye egwu Man Utd esoghi gbaa bọọlụ n'ihi ahụ ọ merụrụ, nke ahụ gosiri ọfụma maka etu Man Utd si gbagide ọnyụpa n'egwuregwu a.

Ka ọ dị ugbua, Chelsea ka ji pọịntị isii aga ha, ebe Burnley na onwe ha ji ohere ahụ rigote n'ogogo 13 na tebulu.

Akụkọ ga-amasị gị