2019 Election: Lee ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọchịchị n'Abia steeti

Njoku chidiebere/Chidinma Eni
Mgbe e biputara ya

BBC Igbo na-agba ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọchịchị n'Abịa n'anwụ tupu ntuliaka 2019 eruo.

Ajụjụ BBC Igbo jụrụ n'elu soshal midia ma 'e nwere ndị dị afọ 18-40 chọrọ ịzọ ọchịchị n'afọ 2019' mịtara mkpụrụ.

Kedụ onye ị ga-akwado n'ime ndị a chọrọ ịnochi ndị Abịa?

Ụlọomeiwu nta

1. Ejikeme Alozie-Nwagboso dị afọ 36 bụ ọgụ ego nke Bekee kpọrọ 'accountant'.

Ọ chọrọ inọchite anya ndị Ụkwa West n'ụlọomeiwu nta.

Ejikeme Alozie-Nwagboso chọrọ ịzọ ọchịchị n'ụlọomeiwu ukwu

2. Adaeze Nnenne Nwokeukwu dị afọ 31 bụ dọkịta.

Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Isiala Ngwa North n'ụlọomeiwu nta.

Adaeze Nnenne Nwokeukwu

Gọvanọ

Fortunes Paul Okoronkwo dị afọ 36.

Ọ bụ onye Isuikwuato chọrọ inọchi Okezie Ikpeazu dịka gọvanọ.

Fortunes Paul Okoronkwo

Ụlọomeiwu nke steeti

1. Chidinma Eni dị afọ 30 bụ onye Ọhafịa.

Ọ chọrọ inọchite anya ndị Ohafia South N'ụlọomeiwu nke steeti.

Chidinma Eni

2. Victor Chinedu Ogbonna dị afọ 31 bụ ojiegoachụego.

Ọ chọrọ inọchite anya ndị Isuikwuatọ n'ụlọomeiwu nke steeti.

Victor Chinedu Ogbonna chọrọ inọchite ndị Isuikwuato n'ụlọomeiwu steeti

3. Njoku chidiebere dị afọ 29 bụ onye ọrụugbo.

Ọ chọrọ inọchite anya ndị Osisioma Ngwa North n'ụlọomeiwu nke steeti.

Njoku Chidiebere

4. Ikenna Uchechi Ogbonna dị afọ 28.

Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Isuikwuato n'ụlọomeiwu nke steeti.

Ikenna Uchechi Ogbonna chọfọ ịnọchi ndị Isuikwuatọ

Cheta na nso nso a, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ mere ka ndị ntorobịa Naịjirịa nwee ike ịzọ ọkwa ọchịchị.

Akụkọ ga-amasị gị