Akụkọ kachasị na mgbede a: Ọchịchị abaala APC isi - Ohaneze

Ike Ekweremmadụ
Nkọwa foto, Akpụkụrụ Ekweremadu ụlọikpe na o kwucheghị ka ọha mgbe ọ banyere ọchịchị
Mgbe e biputara ya

Ohananeze Ndịgbo akatọla njide gọọmenti jidere osote onyeisi Sineti bụ Ike Ekeremadụ.

Ode akwụkwọ mgbasa zi otu a bụ Uche Achi-Okpaga sị na ha bụ ijiji aghọrọla isi membi dịka ọchịchị sịrị baa gọọment APC n'isi.

Okporo gas ga aga n'Abia steeti

Shell na Naịjirịa
Nkọwa foto, Shell na-emepụta 39% mmanu agbidi na Naịjirịa

Ndị ọrụ shell nke Naịjịrịa ekwuputela ebumnobi ha ịrụ okporo mmanụ gas n'ebe ụfọdụ n'Abịa steeti.

Onyeisi ụlọọrụ a bụ Ed Ubong kwuru na a ga-arụ ụzọụgbọ ga-agafe Osisoma, Ogbo Hill nakwa Ariaria maka nke a.

O kwuru nke a mgbe ọ gara ịhụ gọvanọr steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu.

Otu BBOG enwetala nkatọ

BBOG na ụmụaka Chibok
Nkọwa foto, BBOG na-akwanye gọmenti ọkụ ka ha chọta ụmụ akwụkwọ Chibok kemgbe 2014

Otu Coalition Against Terrorism and Extremism akatọla okwu ndị isi na-akwanye gọọment ọkụ ka ha kpọchite ụmụnwaanyị Chibok furu efu bụ Oby Ezekwesili na Aisha Yesufu.

Akụkọ kọrọ n'Ezekwesili na Yusufu boro ndị agha Naịjirịa na ha na-eli ndị otu ha ndị Boko Haram gburu na nzuzo.

Ntuliaka Zimbabwe

Zimbabwe na ntuliaka
Nkọwa foto, Akwụkwọ na-egosi na Zanu-PF na-emeri nduliaka Zimbabwe

Ọgụ adaalanụ na ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị Zimbabwe ka otu pati MDC Allaince na-ebo pati Zanu-PF ebubo ịme nrụrụaka.

Ka ọ dị ugbua, otu onye nọ n'ọzụ maka nke a.

N'egwuruegwu, ndị AAC tọrọ na Legọs

AAC na Asaba
Nkọwa foto, African Athletic Championship bidoro na Asaba tata

N'egwuruegwu, ndị egwuruegwu na a ga-asọmpi African Championship tọrọ na ọdọụgbọelụ Lagọs eruola Asaba n'ụtụtụ tata.

Gee nkeji anyị nke ụtụtụ a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo, Peter Obi siri Ndigbo teta n'ụra.