Goolu abụọ Ibrahimovic nyere LA Galaxy mmeri

Ebe foto si, AFP
Mgbe e biputara ya
Zlatan Ibrahimovic ji ọkpụ goolu abụọ jiri mepo ọnọdụ na otu egwuregwu bọọlu LA Galaxy nke mba Amerịka bụ ebe ọnọzị ugbua.
Mpị a ndi LA Galaxy na ndị Los Angeles FC sọọrọ bu egwuregwu nke mbụ Ibrahimovic so ha agba. N'egwuregwu ahụ, Los Angeles FC ji ọkpụ goolu atọ na-aga Galaxy mana he mechara saa ha niile.
Ibrahimovic, bụ onye dị afọ 36, nyere gollu abụọ na ya bụ asọmpị, otu n'ime ha bu nke o ji isi nye na ngwucha.
Ibrahimovic sị; "a nụrụ m ka ndi mmadu na eti 'Anyi chọrọ Zlatan, anyi chọrọ zlatan."
"Ya mere m jiri nye ha Zlatan. Ha na-akwa m, m na-enyechi ha," Onye egwu a kwuru ka agbachara ya bu asọmpị.

Akụkọ ga-amasị gị

























