Egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọku na Taraba

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe e biputara ya
Nsogbu amalitela ọzọ na gburugburu Mambila plateau dị na Taraba Steeti nke mere ka ndị mmadụ na-atụ ụjọ na-egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo Yelwa na Mesamari dị na Sardauna Local Government na Steeti a.
N'agbanyeghị na ndị hụrụ ihe mere na-akọwa na-egburu ihe karịrị mmadụ 40 na mwakpo a ha sị bidoro n'abalị Satude, ndị uweojii na Steeti ahụ gwara BBC na ha amaghị mmadụ ole ihe metụtara.
Ndị uweojii kwuburu na mmadụ ise nwụrụ na mwakpo nke e mere na Tụsde mgbe ndị Fulani na ndị Mambila nwere esemokwu.
Mana mwakpo a mekwara n'abalị Satụde ma ruo Sọnde, butere ogbugbu ọtụtụ mmadụ.
Ndị uweojii na-akọwa na ebe ihe a mere jụzịrị oyi ka ha zipụrụ ndị uweojii gburuguru ebe ihe a na-eme.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

























