Nigeria Elections 2019: Ihe ise bụ ọgbaraigbogharị merela

Ezekwesili,Duke, nwa ọhụrụ na Galadima
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ntuliaka na Naijiria bụ egwu agwara ọgwa nke bụ na chị bọọ a nụ ọzọ.

Mana o nwere ihe ndị mere nke ọ bụrụ na dịbịa gbara ya n'afa, ọtụtụ ga-asị na ya bụ dibịa amaghị ọrụ n'ihi ka ha siri tụọ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya .

Lee ụfọdụ n'ime ha:

1. Oby Ezekwesili chịsara ọwa n'ọsọ onyeisiala

Oby Ezekwesili

Ọ gbara ọsọ achụmta vootu ya dịka onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu ACPN ka dịmkpa.

Ọ gara ọtụtụ obodo, ya na otu dị che iche mere ọgbakọ, ebe o nwe mkparịaụka ya na ndị ntaakụkọ ịgwa ọha ebumnuche ya.

Mana ka ọ fọrọ naanị otu ọnwa ka e mee ntuliaka, Oby Ezekwesili chịsara ọwa.

O kwuru na ọ bụ iji nye ohere ka ya na ndị ọzọ jikọta aka ọnụ were chutuo otu APC na PDP n'ọchịchị.

Ọ rịọrọ ndị kwenyere ya mgbaghara.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Oge o jiri mee ya na ihe o kwuru kpatara ya tụrụ ndị mmadụ n'anya.

O wutere ụfọdụ chere na ya na Kingsley Moghalu bụ ndị nwere ntozu ịzọpụta Naijiria n'ime ndị sonyere na ndọrịtaụka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala e mere ụbọchị January 19.

2. Pati ACPN ikwado Buhari na 2019

Oby Ezekwesili na onyeisioche pati ACPN mabụrụkwa onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala, Galadima Ganiyu

Ka ndị mmadụ ka na-eche ihe eme Ezekwesili ijiri gbanyụọ ọkụ oge e chere na ọ ga ekwo ụra ekwo, pati ya bụ ACPN dọnyere Buhari ukwu maka 2019.

Ekwesili kwuru na agwa pati ya kpara naanị ka ọ gachara otu abalị ya rituru gosiri na ihe ha ga-erita ka ha mkpa karia ọdịmma Naijiria.

3. Red Card ịdonyere Atiku ukwu

Ndị otu Red Card Movement

Otu Red Card bụ otu Ezekwesili bụ isi e jiri kwawa okpu ha maka ịnapụ otu APC na PDP ọchịchị tụrụ ụmụ Naijiria n'anya oge ha kwuru na ha na-akwado Atiku na ntuliaka 2019.

Ha kwuru na nke bụ iji 'zọpụta naijiria site na-ibido na-enyere Atiku na Obi nkwado.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ndị mmadụ katọrọ ACPN na Red Card maka ire onwe ha n'ihi ihe nweta.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

4. SDP idonyere Buhari ukwu

Donald Duke
Nkọwa foto, Donald Duke kwuru na ya ka nọ n'ọsọ onyeisiala

Oge ha pụtara, ihe ha gwara ụmụ Naijiria bụ na ha bụ otu ga-anapụ APC na PDP ọchịchị dịka 'Third Force'.

Mana pati ahụ tụrụ ụmụ Naijiria n'anya oge ha kwụpụtara na ọ bụ Muhammadu Buhari na APC ka ha ga-eso. gbahapụ Donald Duke bụ onye pati ahụ họpịtara ka ọzọ ọkwa onyeisiala n'aha.

Ihe adịghị Duke mma, o kwuru na ya ka n'ọsọ onyeisiala.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Otu SDP nọ n'ụlọikpe kemgbe Jerry Gana gbara ha akwụkwọ sị ka eme ya onye na-anọchite SDP n'ọkwa onyeisiala.

Gana meriri n'ụlọikpe ukwu mana ụlọikpe mkpeharị nyere Duke mmeri.

5. Nwaanyị mụrụ nwa n'ọsọ achumta vootu

Ifeanyi Okowa

Otu nwaanyị a kpọrọ Odiri Imuere mụrụ nwa na Delta steeti oge gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Ifeanyi Okowa nke PDP gara achụmta vootu n'Okpuru Ọchịchị Ogboru,Delta steeti.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Akụkọ ga-amasị gị: