Bill Gate ewepụtala ijeri dọla anọ maka ịchụ ịba

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe e biputara ya
Onye ọrụ ebere ma bụrụkwa onye nwe Microsoft bụ Bill Gates, gwara BBC na ya na ndị nnyemaka ndị ọzọ ga-eji ihe ruru ijeri dọla anọ ($4bn) kwado mbọ a na-agba iji belata ruo ọkara ọnwụ a na-anwụ site n'ọrịa ịba.
Ọ sị na ego ya ahụ ga-abụ maka inye ụlọmgbochi anwụnta nke a kpọrọ bednet na bekee nke a na-eji agbalahụ mgbasa ọrịa ịba ya na ikewapụta ebe ha dị.
Ebumnobi ọzọ bụ iji chọta ọgwụmgbochi tọrọ atọ.
Gates kwuru nke a oge ya na ndị na-ebu agha megide ịba na otu nkwado ahụike mere ọgbakọ banyere ịba na Lọndọn.
Ngalaba mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ WHO n'aha ịchafụ kwuru na ndị ọrịa ịba metụtara gbalitere rue nde ise site n'afọ 2015 rue 2016.
Dịka WHO siri kwuo, ndị ọ kacha metụ bụ ụmụaka.

Akụkọ ga-amasị gị:

























