Di na nwunye ji ọkụ rọba dakasịa nwatakịrị ahụ n'Anambara abaala n'ụlọmkpọrọ

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe enyela ntuziaka ka a tụbanye di na nwunye; Maazị Chukwudi Chukwunyere gbara afọ iri anọ, na nwunye ya bụ Chisom Chukwunyere gbara afọ iri atọ n'ụlọmkpọrọ maka ebubo imekpa nwatakịrị gbara afọ iri ahụ n'Anambra Steeti.

Cheta na izuụka gara aga ka ihe onyonyo fegharịrị na soshal midịa gosiri ebe igwe mmadụ kpụ Oriakụ Chukwuyere bụ onye a na-ebo ebubo na o ji ọkụ plastik na oriọna nakwa igwe e ji ede akwa rakasịa ahụ nwata nwoke ha na ya bi a kpọrọ, Chiziterem Agaje.

Onyonyoo nwata ahụ wuru ewu na soshal midịa, nke na gọọmenti na ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere Nwunye Gọvanọ Anambra Steeti bụ Nonye Soludo nakwa Kọmịshọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Esther Onyekesi gbataara nwata ahụ ọsọ enyemaka, ebe ndị uweojii nwụchiri di na nwunye ahụ.

Kọmịshọna ndị uweojii Anambara Steeti bụ bụ Ikioye Orutugu kwuru na ndị uweojii emechaala nnyocha nke mere ha jiri kpụpụ di na nwunye ahụ ụlọikpe ebe ụlọikpe nyere iwu ka a tunyegodi ha n'ụlọmkpọrọ dịka ikpe ahụ na-aga n'ihu.

N'ozi nke ndị uweojii wepụtara, Orutugu kelere ndị agbataobi chọpụtara nwata ahụ tupu e gbuo ya, were rịọ ka ndị mmadụ na-agbara uweojii ama ma ha hụ ka ajọ ihe ọbụla na-eme.