Etu ndị ntoroọbịa Ohuhu si napụta mmadụ abụọ a tọọrọ n'Umuahia, Abịa Steeti
Nwanne ị nụkwara nke a si mere n'Abịa Steeti n'ụbọchị Wenezde 10 Juun 2026? A sị na ndị ntoroọbịa napụtara mmadụ abụọ n'aka ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọ n'okpuru ọchịchị ime obodo Ụmụahịa Nọt dị n'Abịa Steeti.
Mmadụ abụọ ahụ a napụtara bụ Onyinyechi Ekechukwu na Izuchukwu Okechi gbara ihe dịka afọ 20 bụcha ndị obodo Umuezerola-Umuawa-Alaocha dị n'okpuru ọchịchị Ụmụahịa Nọt.
Akụkọ kwuru na ndị ntọ tọọrọ mmadụ abụọ ahụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere ise nke mgbede na Nkpu-Ala dị n'okporoụzọ si Ụmụahịa gawa Uzuakọlị, ma were ekwentị nke nwaanyị bụ Onyinyechi kpọọ ndị obodo wee na-achọ ka e nye ha nde naịra iri.
Mana ntụrụkpa bịara mịara ha ojoroko oge ndị ntoroọbịa Ọhụhụ kpọkọtara onwe ha n'igwe, mịrị mma, okpi ma kpọrọkwa ụmụ nkịta waba ọhịa ndị gbara ha okirikiri ma malite ịchọ ndị ahụ a tọọrọ.
Ọnọdụ a mere ka ndị ntọ gbahapụ mmadụ abụọ ahụ ha tọọrọ n'ime ọhịa ma rie mbọmbọ, nke mere ka ndị ntoroọbịa Ọhụhụ napụta ha.
Ndị obodo kwuru na a na-enyo enyo na ndị ntọ ahụ bụ ndị ọchịehi Fụlanị dị mmadụ isii, mana o nwebeghị ihe ndị nchekwa kwurula iji kọwaa ndị ha bụ. Ndị uweojii Abịa Steeti ekwubeghịkwa ihe ọbụla gbasara ya.



