Mwakpo ndị na-eyi ọha egwu adịghịzi ka ọ dị na mbụ na Naịjirịa – Minista nchekwa

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Minista na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa ekwuola na ndị na-eyi ọha egwu adịghị akpazi mkpamkpa ka ha si akpa na mbụ.
Christopher Musa kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ mgbasaozi dị na Naịjirịa nwere n'ụbọchị Tọzde 3 Septemba 2026 bụ ebe ọ nọ kwupụta ọtụtụ ihe dị icheiche maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.
N'akụkọ a BBC News Igbo tinyere anya n'ihe ndị ahụ Christopher Musa kwuru gbara ọkpụrụkpụ.
Anyị emeriela ndị na-eyi ọha egwu
Musa kwuru na Naịjirịa emeriela ndị na-eyi ọha egwu ma kwuo na ha agbanweela etu ha si awakpo ọtụtụ obodo dịka ha bidoro ịtọrọ.
Mgbe a jụrụ ya kọwaa ihe ọ kwuru banyere imeri ndị na-eyi ọha egwu ka ọ zara sị "a ga m agwa gị na ọnọdụ nchekwa adịwala mma. Ọ bụrụ na itulee ya, mwakpo ndị Boko Haram, ISWAP na ndị ọzọ adịghịzị etu o si dị n'oge gara aga".
"Eziokwu anyị emeriela ndị na-eyi ọha egwu. Ntọrị mmadụ bụ ihe na-emebi obodo, ugbua anyị na-ahụ ebe nwaanyị na-atọrọ di ya maọbụ nwoke na-atọrọ ụmụaka ya".

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ọ gwara ndị gọvanọ ka ha kwụsị inye ọgbatumtum dịka nkwado
Minista nchekwa gwara ndị gọvanọ nakwa ndị ọrụ gọọmenti ka ha kwụsị inye ndị mmadụ ọgbatumtum dịka ihe nkwado na-ekwu na ọgbatumtum ahụ na-emechaa banye n'aka ndị na-eyi ọha egwu bụ ndị na-eji ya akpa mkpamkpa gụnyere mwakpo n'ime obodo.
Ọ sị na ọ bụrụ na a ga-enye ndị mmadụ ọgbatumtum na ha chọta nke na-agaghị adịrị ha mfe ịgbaọsọ maọbụ iji ya na-akpa mkpamkpa.
N'okwu ya "anyị na-arịọ ndị gọvanọ nakwa ndị ọrụ gọọmenti ka ha kwụsị inye ndị mmadụ ọgbatumtum maka na ọ bụ ya na-emecha banye n'aka ndị na-eyi ọha egwu. Nke a na-eme ha na-abanye ebe niile ma gbaa ọsọ na ntabị anya".
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ dị mma ka gọọmenti okpuruọchịchị kwụrụ chịmchịm maka na ọ ga-enyereaka kwalite ọnọdụ nchekwa.
Ọtụtụ ihe mere n'oge El-rufai bụ gọvanọ Kaduna steeti – Musa
Na mkparịtaụka ahụ ka Christopher Musa nọ kwuo na ọtụtụ ajọ ihe mere n'oge Nasir El-rufai bụ gọvanọ na Kaduna steeti.
Ọ kọwara na steeti ahụ kewara ụzọ abụọ, n'oge ahụ ọ bụrụ na ị bụ onye si ndịda Kadụna steeti na ị gaghị aga na mpaghara ugwu steeti ahụ gabiri.
Ọ gara n'ihu kọwaa etu ndị ojiegbe si awakpo obodo n'oge ahụ dị egwu mana ugbua na ọ bụghị otu ihe.
O bukwara ebubo na ọtụtụ mgbukpọ mere na ndịda Kaduna oge El-Rufai bụ aka na-achị steeti ahụ.
Ọnọdụ nchekwa na Kaduna steeti n'oge Christoper Musa na-arụtụaka?
Nasir El-Rufai bụ gọvanọ Kaduna steeti bido n'afọ 2015 ruo na 2023 bụ oge mịnịsta nchekwa Naịjirịa bụ Christoper Musa na-arụtụaka dịka oge arụ na igbu mmadụ juputara na steeti ahụ.
Mana akụkọ BBC dere n'oge ahụ gunyere ihe mere n'Ọktoba 2018 mgbe nnukwu ọgụ dapụtara n'etiti ụmụntoroọbịa ụka kraịst na ndị alakụba nke mmadụ ruru iri ise na ise nwụrụ n'ime ya.
Nke a mere Gọvanọ ha n'oge ahụ bụ El-Rufaị ji manye ọnọdụ agaghịaga maọbụ apụghịapụ nke bekee kpọrọ 'Curfew' awa iri abụọ na anọ.































