Onye bụ Ifeanyi Onukwubiri nwe ụlọọrụ 'TMT Travel and Tours' ndị uweojii nwụchiri?

Maazị Ifeanyi Onukwubiri, onye nwe ụlọọrụ 'TMT Travels and Tours', yi uwe dị oji ma jide akwụkwọ njem pasịpọt mba ọzọ na-eji ojii.

Ebe foto si, TMT/ Facebook

Nkọwa foto, Maazị Ifeanyi Onukwubiri, onye nwe ụlọọrụ 'TMT Travel and Tours'.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Nke na-ewu ewu ugbua na soshal midịa bụ na otu ụlọọrụ a kpọrọ 'TMT Travel and Tours' nke ọrụ ya bụ ịchọtara ndị mmadụ akwụkwọ njem 'visa' eji aga mba ofesi egwuola ọtụtụ ụmụ Naijiria wayo.

Onye nwe ụlọọrụ ahụ bụ 'TMT Travel and Tours' aha ya bụ Ifeanyi Onukwubiri nọ n'aka ndị uweojii ugbua na-azara ọnụ ya.

Ndị Uweojii jidere Maazị Onukwubiri na Owere ebe oji mere ụlọọrụ ya ma kpụga ya Abuja ka ọ zara ọnụ ya n'ebubo iri ego ruru nde kwụrụ nde naịra ndị mmadụ na-enyeghị ha akwụkwọ njem 'visa' maka ije mba ofesi.

Maazị Ifeanyi Onukwubiri, onye nwe ụlọọrụ 'TMT Travel and Tours' yi uwe na-acha ọbara ọbara edere aha ụlọọrụ ya bụ TMT ma nọrọ n’ime ụgbọelu.

Ebe foto si, TMT/Facebook

Nkọwa foto, Maazị Ifeanyi Onukwubiri, onye nwe ụlọọrụ 'TMT Travel and Tours' kọ ọ nọ n'ụgbọelu

E boro ya ebubo igwu mmadụ karịrị 200 chadum

Ihe onyonyo pụtara na soshal midịa gosiri ebe otụtụ mmadụ gbakọrọ n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja na-eme ngagharịiwe ka akpụpụta nwoke ahụ ka ọ bịa nyeghachi ha ego ha.

Na ya bụ ihe onyonyo, ndị uweojii kpụpụtara ya ka ọ nụrụ ihe ndị o gwuru wayo na-agabiga.

Ọtụtụ n'ime ha kọwara ka ha siri gbazite ego were nye ya ka o mere ha akwụkwọ njem 'visa,' mana ọ gala ọtụtụ afọ, ma o nweghịkwa 'visa' ha hụrụ.

Ụfọdụ n'ime ha kọwara na onyeisi ụlọọrụ TMT ahụ ji akwụkwọ njirimara ha bụ pasịpọt ha ma jụkwa inyeghachi ha ego ha.

Otu nwaanyị si mba Libya bia Naijiria ka ọnapụta nwoke ahụ nde kwụrụ nde naịra o nyere ya maka imere ya 'visa'.

Nwaamadi ahụ gechara ntị were kwee nkwa na ya ga-amalite ịkwụghachi ndị mmadụ ego ha, ọ rọọrọ biko ka agbaghara ya.

Mana ndị ahụ e kwuru na nwaamadị ahụ gwuru wayo rọọrọ ndị uweojii ka ha jide nwoke ruo mgbe ọ kwụghachiri ego ndị mmadụ o riri n'ihi na ọ gwara ha na mbụ na e nweghị ihe ha ga-eme ya.

Mazi Ifeanyi Olukwubiri, onye nwe ụlọ ọrụ TMT Travel and Tours na Prophet Rolex. Ha abụọ yị otu udi uwe. Ha yi uwe agada ojii na nke elu n’acha ọcha ma nọrọ na ime ụlọ ọrụ TMT.

Ebe foto si, TMT/ Facebook

Nkọwa foto, Mazi Ifeanyi Olukwubiri, onye nwe ụlọ ọrụ TMT Travel and Tours na Prophet Rolex.

Nchọpụta gosiri na nwoke ahụ bụ maazi Onukwubiri nwe ụlọọrụ TMT na-emefusi ego etu o siri maasị ya dịka onyonyo fesara na soshal midịa gosiri oge o mere nkịta ya bụ "Milo" nnukwu ọgbakọ pati nke e kwuru na o riri akatamkpo ego.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii kpụghachiri ya n'ụlọmkpọrọ ma ruo na ha emechaa nnoycha.

Ego otu onye na-akwụ ya nọ na-agbata otu nde naira rue nde naira atọ.

Ọzọkwa bụ na ndị ama ama na soshal midịa na-agbasara ụlọọrụ TMT ozi nke a kpọrọ "advert" n'olu bekee apụtala gọchapụ ụkwụ ha na aka na mpụ nke e boro nwoke ahụ ebubo ya. Ndị ama ama gụnyere Maazị Apama na Prophet Rolex.

Kedụ onye bụ Ifeanyi Onukwubiri nwe ụlọọrụ 'TMT Travel and Tours'?

Ifeanyi Onukwubiri bụ onye Imo steeti. Akụkọ kwuru na a mụrụ ya n'afọ 1987.

Dịka nchọpụta siri gosi, nwaamadi ahụ malitere ụlọọrụ ya 'TMT Travel and Tours' n'afọ 2012.

Ije eji mara ụlọọrụ TMT bụ ịgbatara ndị mmadụ akwụkwọ ịbanye ugbọelu a kpọrọ "Airline ticket maọbụ Airline booking" oteghị aka ọ malitere ịgbasaa ụlọọrụ ya tinye ngalaba inyere ndị mmadụ aka inweta akwụkwọ ị ga mba ọzọ a kpọrọ 'visa'.

Ọ bụ ọrụ inye 'visa' ahụ bụ nke tinyere ya na nsogbu ọ nọ na ya ugbua.

Ụlọọrụ ọzọ Ifeanyi Onukwubiri nwe gụnyere

TMT Barbers: O nwere ọtụtụ ebe a na-akpụ isi n'ụzọ ọgbara ọhụrụ na ọtụtụ ebe na Naijiria.

TMT Cakes: O nwekwara ọtụtụ ụlọọrụ ebe a na-esi achịcha bekee a kpọrọ "cake".

Ya bụ nwoke na-egosikarị na soshal midịa ka o si enyere ụmụ ogbenye aka. Mana ugbua, ụlọọrụ ya abaala na nsogbu maka ebubo ịnapụ ndị mmadụ ọtụtụ nde naira.