Kedụ ka agha Ịran jiri mee ka mmanụ ụgbọala dị ọnụ na Naịjirịa?

Aha onyonyo, Gịnị mere agha Ịran jiri mee ka mmanụ ụgbọala dị ọnụ na Naịjirịa?
Kedụ ka agha Ịran jiri mee ka mmanụ ụgbọala dị ọnụ na Naịjirịa?

Afrịka nwere ihe dịka pasentị asatọ nke ebe nchekwa mmanụ agbịdị n'ụwa – Mana gịnị mere agha a na-alụ n'Iran ji eme ka mmanụ ụgbọala dị oke ọnụ ebe a?

Bịa ka ngwa gị, ọtụtụ mba n'Afrịka ndị na-emepụta mmanụ agbịdị mana ha na-ebuga ya mba ofesi ka e jiri ya rụpụta dizel, petrol na ngwaahịa ndị ọzọ.

Mba ndị a na-azụ mmanụ n'ọnụ ahịa ụwa niile, mana ebe ọtụtụ ụgbọmmiri ka nọ n'Ọwara Hormuz dị n'Iran, ọ na-emetụtakwa ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala n'Afrịka.

Kedụ etu nke a si emetụta Naịjirịa?

Ọ bụghị mmanụ agbịdị a na-emepụta na mpaghara Afrịka ka a na-ere dịka mmanụ ụgbọala.

Kama ihe anyị nwere n'Afrịka karịsịa na Naịjirịa bụ na mmanụ anyị na-emepụta ka a na-ebuga mba ndị ọzọ n'ihi na mba ndị ahụ chọrọ, yana enweghị ụlọ nrụpụta mmanụ ụgbọala bụ 'Refinery' olu bekee.

Mmepụta mmanụ agbịdị Naịjirịa amụbaala site n'otu nde na narị puku abụọ (1.2 million) kwa ụbọchị ruo ihe dịka otu nde na narị puku anọ (1.4 Million) maọbụ otu nde na narị puku ise (1.5 million) nke mmanụ agbịdị mana anyị ka na-enweta ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala na dizel dị elu n'ihi na anyị anaghị arụpụta mmanụ anyị na-eji eme ihe kwa ụbọchị.

Ụlọọrụ mmepụta mmanụ ụgbọala bụ Dangote Refinery nọ ebe a, mana anyị hụrụ ihe mere n'etiti Dangote na ụlọọrụ NNPC nke mere n'ọnụ ahịa mmanụ ụgboala dị elu n'ụfọdụ ebe, ọ dịkwa ọnụala n'ụfọdụ ebe.

N'agbanyeghị na anyị nwere Degote Refinery, gịnị mere anyị ka ji na-enweta ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala dị elu ma ọ bụrụ na ọ na-emepụta ma na-eresị ọdọ mmanụ dị iche iche?

Dangote ka na-azụta mmanụ site na mba ofesi n'ihi na anyị anaghị emepụta ihe zuru oke iji nye 'Dangote Refinery'.

Ọzọ bụna, Gọọmenti Naịjirịa na-ekwe ndị na-etinye ego maọbụ ndị na-emmepụta akụrụngwa na Naịjirịa nkwa iji mmanụ agbịdị akwụghachi ha ụgwọ.

Ya mere, anyị ejidela mmanụ agbịdị anyị ọbụlagodi ndị anyị egwupụtabeghị n'ala.

N'ikpeazụ, agha Iran na-egosi etu Naịjirịa na mba ndị na-emepụta mmanụ agbịdị n'Afrịka si adabere n'ahịa mmanụ ụwa.

Ọ bụ ezie na nsogbu mbupu na-eme ka ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala na-abawanye n'ọtụtụ mba dị na mpaghara Afrịka.

Mana nke bụ eziokwu bụ na ọbụrụ na ị naghị anụcha mmanụ agbịdị gị bụ 'crude' nke ọnụ ahịa ya dị elu ugbua, nke a pụtara n'ọnụ ahịa ngwaahịa dịka mmanụ ụgbọala arụpụtara arụpụta ga-adị elu karịa.