Onye bụ Abu-Bilal Al-Minuki ndịagha Amerịka gburu na Naịjirịa?
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
N'ụtụtụ Satọde 16 Mee 2026, ka Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru na ndịagha Amerịka egbuola osote ọchịagha otu ISIS na mbaụwa bụ Abu-Bilal Al-Minuki site na mgbakọaka ha na ndịagha Naịjirịa.
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu na ndịagha Naịjirịa wepụtakwara ozi nke ha iji kelee ndịagha Amerịka maka enyemaka ha n'igbu Abu-Bilal Al-Minuki na ụfọdụ ndịagha ya, tinyekwara agha a na-ebu megide ndịagha nnupuisi.
I nwereike ịdị na-ajụ onwe gị sị onye bụ Abu-Bilal al-Minuki?
A mụrụ Abu-Bilal al-Minuki n'afọ 1982 n'obodo Mainok dị na mpaghara Benisheikh na Borno Steeti.
Ndị ọkachamara kwuru na aha njirimara ya bụ Mainuki nwereike ịbụ nke sitere na Mainok, nke bụ otu obodo dị na Borno steeti, n'ihi na ọ bụ ọdịnaala ndị bi na mpaghara ahụ iji aha obodo maọbụ ezinaụlọ mmadụ mara ya.
Ndịagha Naịjirịa kwuru na Abu-Bilal al-Minuki kpara ike dị egwu ịchịkọta ọrụ ndị otu Islamic State na mba ndị ọzọ na-abụghị Naịjirịa, tinyere mgbasaozi, ịrụpụta ngwaọgụ, ogbunigwe na droonu.
Ozi ndị nchekwa nwetara na-atụ aro na ọ dị ka ha bugoro ya n'ọkwa Onyeisi na-ahụ maka mba niile na nso nso a, iji mee ka ọ bụrụ otu n'ime ndị ọkwa ha kachasị n'otu Islamic States na mbaụwa.
Tupu nke ahụ, ndị nchekwa kwuru na ọ bụ ya hụrụ maka mwakpo niile ndị otu Islamic State mere na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka, nke gụnyere mwakpo ndị e mere ụmụ mmadụ nkịtị n'ime obere obodo dị iche iche.
Ndịagha na-arụ aka na ọ bụ Abu-Bilal al-Minuki hụrụ maka ntọrị ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị karịrị otu narị n'obodo Dapchi dị na Yobe Steeti n'afọ 2018.
Onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi ndịagha Naịjirịa bụ Samaịla Uba kwuru na Abu-Bilal al-Minuki nyekwara aka kpọgaa ndịagha nnupuisi na mba Libịa iji kwado ọrụ Islamic States na mpaghara Ugwu Afrịka.
A kọwara Abu-Bilal al-Minuki dịka ọchịagha Boko Haram ọkwa ya dị elu, tupu ọ ṅụọ iyi ọrụ n'otu Islamic States n'afọ 2015.
N'afọ 2024 ka ndịagha kwuru na ha egbuola Abu-Bilal al-Minuki, mana ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Michael Onoja kọwara na ọ bụ onye nke a ha gburu ugbua bụ Abu-Bilal al-Minuki n'onwe ya.



