Ị ma na i nwereike iji akara 100 banye ụlọakwụkwọ dị elu?

Aha onyonyo, Ị ma na i nwereike iji akara 100 banye ụlọakwụkwọ dị elu?
Ị ma na i nwereike iji akara 100 banye ụlọakwụkwọ dị elu?

Okwe ule Jamb nke afọ 2026 agbaala, nke mere ka ọtụtụ ndị lere ule ahụ chịrị obi n'aka n'ihi na ha amaghị ma ha ga-eso na ndị ụgbọ ga-aghara.

Mana n'ụbọchị Mọnde abalị 11 Mee 2026 ka Jamb kwuru na ha ga-aga n'ihu gbakwasị ụkwụ n'akara otu narị na iri ise dịka akara opekatampe maka ndị chọrọ ịbanye na mahadum n'afọ agụmaakwụkwọ 2026 banyere 2027.

N'otu aka ahụ, Jamb kwupụtara akara otu narị na iri ise maka ndị chọrọ ịbanye na kọleji a na-azụ ndị nọọsụ, ebe akara otu narị bụ maka ndị chọrọ ịbanye n'ụlọakwụkwọ nkanụzụ polytechnic.

Ihe nke a pụtara bụ na o nweghị ụlọakwụkwọ ọbụla e nyere ikike ịnabata ụmụakwụkwọ akara ha na-erughị etu a, mana ha nwere ikike ibugo akara opekatampe ha maka ụmụakwụkwọ ndị na-achọ ohere agụmaakwụkwọ.

Ọnọdụ a na-abịa dịka minista na-ahụ maka mmụta bụ Tunji Alausa kwuru na ụmụakwụkwọ ndị na-achọ ohere agụmaakwụkwọ na kọleji a na-azụ ndị nkụzi nakwa ngalaba ọrụugbo agaghịkwa ele ule UTME, mana ha ga-edebanye aha ha n'ụlọọrụ Jamb.

Dịka Alausa siri kwuo, ọ gwụchaala Credit anọ bụ ntozuoke a chọrọ maka ụmụakwụkwọ ndị na-achọ inweta ohere agụmaakwụkwọ maka nzere National Certificate in Education nakwa National Diploma na ngalaba ọrụugbo.

Minista ahụ kwukwara na afọ iri na isii ka bụkwa afọ opekatampe e ji abanye n'ụlọakwụkwọ ndị dị elu na Naịjirịa.