Ihe ị ga-eme ka egbe eluigwe ghara ịgbagbu gị

Aha onyonyo, Ihe ị ga-eme ka egbe eluigwe ghara ịgbagbu gị
Ihe ị ga-eme ka egbe eluigwe ghara ịgbagbu gị
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Hei! Ị ma na amụma mmiri na egbe eluigwe nwereike ịgbagbu mmadụ n'eziokwu?

N'ụbọchị Wenezde ka egbe eluigwe gbagburu onye uweojii aha ya bụ Abdulkadir Garba oge ọ na-atụziri ụgbọala aka.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Borno Steeti bụ Nahum Daso kọwara na njinji ahụ jiri mgbe oke ifufe na-efe, dịka mmiri na-akwado izo n'ụbọchị ahụ.

Ọ bụkwa etu a ka egbe eluigwe siri gbagbuo mmadụ atọ ma merụọ mmadụ anọ ndị ọzọ ahụ n'afọ gara aga, n'ahịa Ezi Uzi dị nobodo Obidi Agwa n'okpuruọchịchị ime obodo Oguta dị n'Imo steeti.

Ndị a abụghị ndị nke mbụ maọbụ ndị nke abụọ amụma mmiri na egbe eluigwe na-agbagbu, ọkachasị n'oge mmiri na-ezo, mana gị onwe gị nwereike inye aka kwụsị ọdachi a, naanị ma gị gbasoo ụkpụrụ ndị a ma ọ bụrụ na mmiri na-akwado izo:

  • Nke mbụ: Gbaba n'ime ụlọ ma gị nụ ụda egbe eluigwe, ma zerekwa ịnọ n'akụkụ ụzọ maọbụ mpio.
  • Nke abụọ: Zere ịnọ n'ebe dị elu dịka n'ugwu.
  • Nke atọ: Gbaara mmiri ọsọ ozugbo, ma zere imetụ aka n'osisi ọkụ latrik maọbụ ahụ aja.
  • Nke anọ: Anwakwala anwa gaa izere mmiri n'okpuru osisi, ọkachasị ndị nke kwụụrụ onwe ha.
  • Nke ise: Gbaara ngwa eletrọnik ọsọ ma kwụpụ ha n'ọkụ latrik ozugbo.

Mee nke dị gị n'aka ma hapụrụ Chukwu ndị nke fọrọ afọ, maka na onye chi na-azọ, na-azọ onwe ya.