Raila Odinga riot: E gburu ndị na-esoghi eme ọgbaaghara na Kenya - BBC Eye
Nnyocha BBC achọpụtala na mmadụ atọ ndị uweojii mba Kenya gbagburu n'akwamozụ Raila Odinga bụbu Praịm Minista, esoghị n'ọgbaaghara kpatara ndị uweoji ji na-agba egbe n'ama egwuregwu Kasarani dị na Nairobi.
BBC Africa Eye nyochara ihe karịrị foto na ihe onyonyo 1,500 gbasara emume nke ụbọchị 16 Ọktoba 2025, na-egosi na ndị e gburu anọghị nso ebe ọgbaaghara ahụ mere dịka ha nọ n'ebe ruru mita 60 (197 ft) na mita 160 site n'ebe ọgụ ahụ na-eme.
Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba Kenya, bụ Kipchumba Murkomen, gwara BBC na ndị uweojii gosipụtara "njide onwe" mgbe igwe mmadụ malitere ịtụ okwute.
Cheta na Odinga bụ otu onye n'ime ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na mba Kenya, nwụrụ n'ubọchi 15 Ọktoba oge ọ gbara afọ 80 ka ọ na-anata ọgwụgwọ n'India.
Chetakwa na ọtụtụ puku mmadụ bịara ịkwanyere ya ugwu ikpeazu, mana ọgbaaghara dapụtara mgbe ụfọdụ ndị na-eru uju chọrọ ji ike banye n'ebe a haziri ndị ọbịa pụrụ iche n'ama egwuregwu ahụ.
Gụọ maka akụkọ a n'uju n'ebe a BBC achọpụtala na ndị na-eru uju ndị uweojii gburu na Kenya n'akwamozu Raila Odinga esoghị mee ọgbaaghara



