Igwe mmadụ sị na anyị zuru 'ohi amụ' - ebubo na-agbasa na soshal midịa

Ebe foto si, Alfred Lasteck / BBC
- Onye dere ya, Mungai Ngige
- Ndị mere akụkọ a, BBC Global Disinformation Unit
- Onye dere ya, Alfred Lasteck
- Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
- Ebeg o si, Tunduma
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
E gburu ihe karịrị mmadụ iri asatọ '80' bido n'ọnwa Ọktoba 2025 ruo Julaị afọ a maka ebubo ụgha metụtara ihe a na-akpọ "izu ohi akụkụ ahụ mmadụ", BBC Global Disinformation Unit chọpụtala nke a mgbe ha tulechara ndekọ ndị uweojii na mba Afrịka isii.
Ihe e ji gbuo ndị a bụ maka ebubo na mgbe ọbụla ha metụrụ mmadụ aka, ihe onye ahụ ji bụrụ nwoke efuo maọbụ takpọọ. Nke a bụ asịrị na okwu ụgha soshal midịa na-ekesa na-enweghị nkwado sayensi.
"Ha na-eti mkpu sị na anyị zuru ohi amụ mmadụ, anyị enweghi etu anyị ga-esi gbaa ọsọ maka na igwe mmadụ gbara anyị okirikiri". Boniface Mgala bụ onye na-arụ ụgbọala na mba Tanzania. Ọ kọwara ihe ọ gabigara n'ọnwa Eprel mgbe igwe mmadụ tiri ya ihe maka ebubo ịbụ onye 'ohi amụ'.
Ihe mere ya dịka ihe mere ndị BBC hụrụ n'onyonyo; nwoke na-eti mkpu na amụ ya na-efu efu ka mmadụ metụrụ ya aka, igwe mmadụ ejide onye e boro ebubo na-eti ya ihe ma gwa anyị ka anyị nweghachita amụ a sị na anyị zuru.
Ihe dị tuo abụghị ihe ọhụrụ n'Afrịka ọkachasị n'ebe ndị mmadụ nwere nkwenye n'ịta amusu na oke ụjọ. Soshal mịdịa so na-amụnye ọkụ n'oke ụjọ a.

Na Zambia, asịrị banyere ohi amụ mmadụ malitere ịgbasa nke ukwuu n'ọnwa Maachị mgbe igwe mmadụ gburu otu nwaanyị maka ebubo ahụ. N'oge ahụ, ụjọ gbasara gafee okeala Zambia ruo Tanzania.
N'ụlọ ya dị na Mpemba, dị nso na Tunduma, bụ obodo azụmahịa na-ekwo ekwo dị n'akụkụ okeala Zambia, Mgala na-egosi ihe e mere ya, jiri mma merụọ ya ahụ dịka ọ na-akọ ihe ọ gabigara.
Ọ sịrị: "Ọ bụrụ na m maara na ọnwụ dị m nso n'ụbọchị ahụ, agaghị m aba n'ụlọ ariri ahụ iri nri. Mana mmadụ anaghị ama mgbe ọnwụ ga-eru ya nso."
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mgala, onye edozi ụgbọala, na enyi ya gara Tunduma n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel ka ha zutere onye ahịa gbasara ire ụgbọala. Tupu ha amalite ọrụ ha, ha kpebiri iri nri ehihie. Ozugbo ha nọdụrụ ala n'ụlọ nri ahụ, igwe mmadụ dọkpụrụ ha kpụpụ ha n'ezi.
Ọnya abụọ ọzọ dị n'agba ya na otu eze ya furu efu bụkwa ihe ndị ka na-egosi ahụhụ ọ tara mgbe e tiri ya ihe n'igwe.
Mgbe a na-eti ya ihe, Mgala kubiri ume. Ọ bụ n'ụbọchị abụọ ka o tetere n'ụlọọgwụ, ebe a gwara ya na e gburu enyi ya nwoke e jidere ha abụọ.
Ugbu a, n'ụlọ ya ebe ya na nwunye ya na ụmụ ha anọ bi, ọ na-aga ije nwayọọ nwayọọ n'ihi mmerụ ahụ, ma na-ekwu na isi ọwụwa na-adị awa ya mgbe niile.
Ọ nweghị ike ịlaghachi n'ọrụ ya dịka mekaniiki, mana o kwuru na ndị agbata obi na ndị enyi ya na-enyere ya aka ịkwụ ụgwọ ụfọdụ o ji .
N'otu ụbọchị ahụ a wakporo Mgala na enyi ya, Michael Silavwe, onye na-ese foto azụmahịa ma bụrụkwa ọchụnta ego, kwuru na awakporo ya onwe ya n'ihe yiri nke ahụ na mba Tunduma. Ọ sịrị na ụjọ amalitela ịba ụba mgbe onyonyo banyere amụ e kwuru na e zuru malitere ịgbasa na TikTok.
N'ezi ụlọahịa ya, ọ hụrụ ndị mmadụ ka ha na-agba ọsọ na-ekwu na e boro otu nwoke ebubo, a na-eti ya ihe, ma mechaa gbaa ya ọkụ.
"Mgbe ha kpọrọ ya ọkụ, ndị uweojii bịarutere ebe ahụ, onye ọ bụla wee gbasaa, gbaa ọsọ." nwa a dị afọ iri abụọ na atọ gwara BBC.
N'otu vidiyo BBC Global Disinformation Unit nyochara, nke ndị kiriri ya karịrị ugboro 100,000 na TikTok nakwa Facebook, a hụrụ igwe mmadụ ka ha na-eti otu nwoke ihe na-agwa ya weghachite amụ e kwuru na o zuru.
"Udiri ebubo a na-agbasa, a na-eti ndị mmadụ ihe maka ya" Silavwe kwuru nke a ma gbakwụnye na ndị na-eto eto dịka ya na-atụ ụjọ maka ihe ahụ mana ha chọpụtara nọ ọ bụ asịrị ụgha.
Asha Steven Mwakilasa dị afọ iri ise, na-akwa uwe na Tunduma na mpaghara Momba kwuru si: "e mechere ghọta na ọbụghị eziokwu."
Mana nke a abụghị ụjọ na-atụ ya maka di ya maọbụ nwa ya nwoke ma ha nọrọ n'iro. Ọ sị na afọ juru ya na ndị uweojii ebidola ịnọ n'ebe dị icheiche.
Kọmịshọna na Momba aha ya bụ Elias Daniel Mwandobo gwara BBC kwuru na nnyocha ha na-eme gosiri na "e nwere ndị na-abụ ha zuo ohi, ha ebo ndị ọzọ ebubo ka ha kpuchie ihe ha mere.
Vidiyo ọzọ anyị hụrụ na Dar es Salaam, bụ obodo kachasị ukwuu na Tanzania, na-egosi ìgwè mmadụ na-amaja otu nwoke n'okporoụzọ n'ebe ọdọ ahịa . Ha na-adọ ya n'akwa, na-adọkpụ ya, na-etikwa ya ihe, na-achọ ka o weghachite amụ ha kwuru na o zuru, ebe nwoke ahụ na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha.
Ngalaba BBC na-ahụ maka ịchọpụta na ịkọwa ozi ụgha wetekwara vidiyo ndị yiri nke a nke na-egosi mwakpo ndị mmadu mere na Mozambique nakwa Kenya.
A na-ekesa ọtụtụ vidiyo yiri nke a, akụkọ ndị mmadụ kwuru na ha hụrụ maọbụ dabaa n'ọnwụwa ahụ n'onwe ha, na adọ aka na ntị gbasara ihe ha kwuru na o mere, nkọwa dị iche iche, na vidiyo ndị na-egosi ya juru na TikTok na Facebook.
Ọtụtụ n'ime vidiyo BBC nyochara na-egosi ihe mere, na ka ìgwè mmadụ mere ndị e boro ebubo ka dị n'ịntanetị ruo taa.
Onye na-ekwuchitere Meta kwuru, sị: "Anyị na-enyocha ihe ndị mmadụ na-ekesa, anyị ga-ewepụ ihe megidere iwu anyị."
TikTok azabeghị ajụjụ BBC juru ha.
N'ihe banyere ụfọdụ ndị na-emepụta ihe nkiri na soshal midia na-akpọ oku, agwa ndị ndị mmadụ kpachara anya ha maka ihe na-eme, odobeghi anya na ha amakwa na akụkọ ahụ bụ okwu ụgha.
Dị ka onye odeakwụkwọ Julien Bonhomme si kwuo, ekwentị mkpanaaka na mgbasa ozi mmekọrịta mmadụ na ibe ya emeela ka asịrị na-agbasa ngwa ngwa, rute ọtụtụ mmadụ karịa, ma bụrụkwa ihe siri ike ịchịkwa ozugbo ha malitere ịgbasa.
N'akwụkwọ ya ọ kpọrọ 'The Sex Thieves: The Anthropology of a Rumor', ọ nyochara otu akụkọ gbasara ndị a na-akpọ "ndị ohi mmadụ isii" si agbasa nakwa ihe kpatara ndị mmadụ ji ekwere n'asịrị ahụ.
Ọ sịrị na ndị mmadụ anaghị anụ naanị akụkọ na amụ mmadụ na-efu; kama, ha na-ahụkwa ndị nwoke na-enwe nnukwu nchekasị na-ekwu na amụ ha na-efu, ma ọ bụ na-ekiri ìgwè mmadụ ka ha na-awakpo ndị e boro ebubo ahụ.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Mba nke a kacha metụta bụ Mozambique, ebe ndị uweojii kwuru na mmadụ ruru iri ise na ise ka e gburu maka ya, ma onye uweojii, onye ọrụ bekee ma ndị ọrụ ahụike so na ndị e gburu maka ebubo a.
Onyeisiala mba Mozambique's bụ Daniel Chapo katọrọ asịrị ụgha ahụ na-efegharị nakwa ndị e ji maka na-egbu ma kwuo na enwebeghị usoro ahụike kwuru na akụkụ ahụ mmadụ ọbụla ga-efu efu.
Ndị ọrụ ahụike e gburu maka ebubo bụ n'ụlọọrụ ha nakwa n'ụlọ ha ka a nọ bo ha ebubo. Nke a mere n'ọnwa Eprel na mpaghara Cabo Delgado bụ okeala ha na mba Tanzania.
Ụlọọgwụ niile dị n'ebe ihe a mere mechiri ihe ruru izuụka dịka ha na-agbasa ozi megide asịrị ụgha ahụ.
Nke mere nsonso a mere na mba Kenya dịka mmadụ ise nwụrụ n'oge igwe mmadụ wakporo ha na mpaghara Kwale na Mombasa.
N'ọnwa Julaị ka Mohamed Noor bụ kọmịshịọna Mombasa County kataọrọ ndị na-eme ejije na soshal mịdịa maka ịkesa asịrị ụgha ahụ "maka na ọ ga-adọta ndị ga-ekiri onyonyo ha".
Noor gwara BBC sị na "Mana ikesa okwu ụgha ahụ nwereike ibute ọnwụ mmadụ"
Ọ sị na ndị uweojii ejidela ọtụtụ mmadụ maka ihe nke gunyere nna na nwa bụ ndị a tụrụ mkpọrọ otu afọ, maka iti nwaanyị ihe maka ebubo izu ohi amụ.
Udiri asịrị ahụ butekwara igwe mmadụ iwakpo mmadụ na Malawi nke butter ọnwụ mmaụ asaa.
Mana na Tunduma n'ogbe dị na mba Tanzania, dịka Mgala na-enweta one ya n'ihe e tiri ya, mana ihe ọ hụrụ apụbeghị ya n'obi.
Ọ sị na "Ọ na-enwute m nke ukwuu, enyi nwoke nwụrụ maka ya, ruo ugbua amabeghị m ihe na-eme".
"I nọkata ịhụ ebe igwe mmadụ na-atụ gị okwute, ma gbuo mmadụ".






























