BBC achọpụtala na ndị na-eru uju ndị uweojii gburu na Kenya n'akwamozu Raila Odinga esoghị mee ọgbaaghara

Nnyocha BBC achọpụtala na mmadụ atọ ndị uweojii mba Kenya gbagburu n'akwamozụ Raila Odinga bụbu Praịm Minista, esoghị n'ọgbaaghara kpatara ndị uweoji ji na-agba egbe n'ama egwuregwu Kasarani dị na Nairobi.
BBC Africa Eye nyochara ihe karịrị foto na ihe onyonyo 1,500 gbasara emume nke ụbọchị 16 Ọktoba 2025, na-egosi na ndị e gburu anọghị nso ebe ọgbaaghara ahụ mere dịka ha nọ n'ebe ruru mita 60 (197 ft) na mita 160 site n'ebe ọgụ ahụ na-eme.
Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba Kenya, bụ Kipchumba Murkomen, gwara BBC na ndị uweojii gosipụtara "njide onwe" mgbe igwe mmadụ malitere ịtụ okwute.
Cheta na Odinga bụ otu onye n'ime ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na mba Kenya, nwụrụ n'ubọchi 15 Ọktoba oge ọ gbara afọ 80 ka ọ na-anata ọgwụgwọ n'India.
Chetakwa na ọtụtụ puku mmadụ bịara ịkwanyere ya ugwu ikpeazu, mana ọgbaaghara dapụtara mgbe ụfọdụ ndị na-eru uju chọrọ ji ike banye n'ebe a haziri ndị ọbịa pụrụ iche n'ama egwuregwu ahụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Mana n'ihe onyonyo BBC nyochara, a hụrụ ka a na-atụ ihe dị iche iche, gụnyere oche rọba, ma BBC enwetaghị ihe akaebe gosiri n'okwute so n'ihe ndị a tụrụ.
BBC nyochara ihe karịrị foto na ihe onyonyo 1,500 iji chọpụta ebe ndị e gburu nọ n'ama egwuregwu ahụ na 16 Ọktoba 2025. Ha na ụfọdụ ndị ikwu ndị ahụ nwụrụ anwụ kwukwara okwu.
Nnyocha ihe akaebe BBC mere na-egosi na o nwereike ịbụ ndị uweojii pụrụ iche na-echekwa Onyeisiala gbara egbe gburu ndị ahụ.
Raila Odinga, onye bụ otu n'ime ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama na mba Kenya na onye ndu ndị na-ama gọọmenti aka kacha nọ ogologo oge, nwụrụ oge ọ na-anata ọgwụgwọ na mba India.
Ka otu afọ gachara, ụlọọrụ 'Independent Policing Oversight Authority (IPOA)', nke na-enyocha ọrụ ndị uweojii Kenya, ka na-enyocha ọnwụ ndị ahụ na omume ndị uweojii. E nwebeghị onye a maara ikpe maọbụ zara ajụjụ maka ọnwụ ndị ahụ.
Minista na-ahụ maka ihe na-eme n'obodo gbachitere ndị uweojii, na-ekwu na ha nọ n'oke nrụgide mgbe ha rụchara ọrụ ọtụtụ awa n'enweghị ezumike.
Murkomen kwuru, sị: "Ụlọọrụ kwụrụ onwe ya na-enyocha ọrụ ndị uweojii na-eme nchọpụta a. Anyị kwenyere na ihe ha chọpụtara ga-enyere anyị aka ime ihe iwu kwadoro."
Mgbe a jụrụ ya ajụjụ banyere omume ndị uweojii, ọ sịrị: "Echeghị m na e nwere onye nọ ọdụ ebe ahụ na-ekwu sị, 'Gbaa egbe ugbu a.' Ọ bụ mkpebi ndi uweojii mere oge ahụ ọgbaghara na-eme."
Yvonne Akinyi, onye di ya so n'ndị e gburu, gwara BBC na ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi ichekwa ha bụ ndị butere ha obi mgbawa.
Ọ sịrị: "Ndị anyị na-ele anya ka ha chekwaa anyị bụkwa ndị na-akpatara anyị ihe mgbu. Ọ bụ ha na-eme ka anyị bụrụ ụmụnwanyị di ha nwụrụ anwụ mgbe anyị ka bụ ụmụ agbọghọ, meekwa ka ụmụ anyị bụrụ ụmụ ogbenye."
Ọnwụ Odinga mgbe ọ gbara afọ 80 kpalitere oke iru uju n'ofe Kenya. Ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara n'ọdọụgbọelu Jomo Kenyatta dị na Nairobi mgbe e bugara ozu ya n'ụlọ.
Ozu ya e kwesịrị ịdọsa n'ụlọomeiwu maka iru uju ka e bugara ama egwuregwu Kasarani n'ihi ọnụọgụgụ ndị mmadụ bịara ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ. Mana n'ihi oke igwe mmadụ na ụjọ na a ga-enwe nsogbu nchekwa, a gbanwere ebe ahụ n'oge ikpeazụ, ma bugazie ya n'ama egwuregwu Kasarani.
Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na ha enweghị oge zuru ezu iji hazie ebe ahụ, nke nwere ike ịnabata mmadụ 48,000. Ọtụtụ puku mmadụ wụbara n'ọgbọ egwuregwu ahụ na n'ebe ndị na-ekiri egwuregwu na-anọ n'enweghị onye gbochiri ha.
Mgbe ndị mmadụ chere ọtụtụ awa n'okpomọkụ ruru ogo Celsius 30 ka ha hụ igbe ozu ahụ, n'enweghị igwe okwu ọha iji nye ha ozi gbasara ihe na-eme, ụfọdụ n'ime ha malitere ịtụ ihe, gụnyere oche plastịk, n'ebe ndị uweojii na-eche ọnụ ụzọ ebe ndị ọbịa pụrụ iche nọ.
Ndị uweojii gbara egbe mgbe ndị bịara emume ahụ malitere ịnubata n'ebe ahụ. Mana ihe onyonyo ndị e sere n'akụkụ ama egwuregwu ahụ gosiri na ọtụtụ n'ime igwe mmadụ ahụ anaghị eme ihe ike.
N'ozuzu, mmadụ atọ nwụrụ.
Otu n'ime ha bụ Evans Kiche, onye dị afọ 40, onye na-arụ ọrụ isi nri na nna ụmụaka asaa.
Nnyocha BBC gosiri na ọ nọ ihe dịka mita 60 site n'ebe ọgbaaghara ahụ mere mgbe mgbọ tụrụ ya n'isi gbuo ya.
Ndị ọzọ bụ Vincent Ogutu na Jidah Burka, nọ n'ala mita 160 site n'ebe ọgbaghara ahụ mere.

Ebe foto si, BB
Nnyocha ozu gosiri na Ogutu nwụrụ n'ihi mmerụ ahụ sitere n'ịgba egbe n'obi, ebe a gbagbukwara Burka, onye dị afọ iri anọ na abụọ, n'isi.
Dịka BBC Africa Eye si chịkọta usoro ihe ahụ merenụ, ha chọpụtara na opekatampe ndị uweojii asatọ na-arụkọ ọrụ ọnụ, yi uwe agha na ihe mkpuchi agha. Ndị uweojii a nwere egbe, enweghị akara a na-ahụ anya mana ihu ha kpuchiri ekpuchi.
Uwe ha na mmegharị ha dabara n'ihe a na-ahụ n'aka ndị nche e kenyere ichekwa Onyeisiala William Ruto na ndị ọzọ a na-asọpụrụ pụrụ iche, tupu na mgbe ihe ịgba egbe ahụ gasịrị. Opekatampe, ndị uweojii atọ n'ime otu a yiri ka ọ bụ ha gbara egbe ha.
BBC chọpụtara na mmadụ atọ n'ime ha so n'otu ndị uweojii pụrụ iche na-ahụ maka nchekwa onyeisiala.
BBC enweghị ike ịchọpụta mgbọ gburu onye ọ bụla ihe a metụtara, ọ nweghịkwa ike iwepụ ndị uweojii ndị ọzọ na-agba egbe n'ime ama egwuregwu ahụ.
Otu ndị uweojii mba Kenya gwara BBC sị: "E nwere nnukwu ihe mmụta sitere n'ihe ndị mere n'ụbọchị ahụ," bụ ndị "tọrọ ntọala dị mkpa maka ịrụ ọrụ nke ọma na n'ụzọ ọkachamara karị n'ọdịnihu."
IPOA azaghị ajụjụ gbasara okwu a.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Nwunye Ogutu gwara BBC na nwoke ahụ, onye dị afọ 36 ma bụrụkwa nna ụmụaka atọ, ebughị n'obi ịga Kasarani. Ọ nọ n'etiti obodo Nairobi n'ụtụtụ ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba ya na ndị enyi ya mgbe ha hụrụ igwe mmadụ na-aga n'ama egwuregwu ahụ, ha wee kpebie iso ha gaa.
N'ime awa ole na ole, ka ọ nwụrụ.
Nwunye nwoke ahụ nwụrụ anwụ, bụ Yvonne Akinyi, kọwara otu ogbugbu ahụ si kpata ọgbaaghara n'ezinụlọ ha, na-ekwu na ụmụ ha aghọọla ụmụaka enweghị nna ugbu a.
Ka ọ na-akwado ịhazi ncheta otu afọ kemgbe di ya nwụrụ, Akinyi aghọtabeghị banyere ihe kpatara ọnwụ di ya, onye nwụrụ mgbe ọ gara ịkwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu n'emume gọọmentị haziri.
"M ga-anwa ịbụ nwanyị siri ike. Nwanyị siri ezigbo ike. Mana n'ime obi m, e nwere oghere," ka o kwuru.
Ọ na-ewute nke ukwuu n'ihi na mgbe ụfọdụ, ị nọdụ ala ma jụọ onwe gị ajụjụ. Na Kasarani, e nwere ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ n'ime ha. Gịnị mere o ji bụrụ ya?

























