Emmanuel Uduaghan bụbu Gọvanọ Delta state anwụọla

Onye bụbu gọvanọ Delta state bụ Emmanuel Uduaghan
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onye bụbu Gọvanọ Delta state bụ Emmanuel Uduaghan anwụọla n'afọ iri asaa na otu.

Uduaghan nwụrụ n'abalị iri na itoolu nke ọnwa October 2026 dịka nwa ya bụ Toju Anire Uduaghan kwupụtara ọnwụ ya n'ozi o wepụtara n'aha ezinaụlọ ha.

Cheta na nke a abụghị oge mbu akụkọ na-apụta na Emmanuel Uduaghan anwụọla.

Na June 26, 2026 ka ozi na-efeghari na soshal midia ma kwuo na Emmanuel Uduaghan.

Ezinaụlọ ya kọwaara ọnwụ ya dịka oke ihe mfunarị nye ha, ma sị na ndụ ya na ọrụ ya metụtara ọtụtụ ndị mmadụ na Delta State nakwa Nigeria.

"Ọ bụ ikike, nna, nwanne nye ọtụtụ ndị mmadụ. Ọnwụ ya ga-emetụta anyị nke ukwuu," ke ezinaụlọ ya kwuru.

Emmanuel Uduaghan bụbu Gọvanọ Delta state

Ihe ikwesiri ịma maka Emmanuel Uduaghan

Emmanuel Uduaghan bụbu Gọvanọ Delta state
  • A mụrụ Dr Emmanuel Eweta Uduaghan n'ụbọchị 22 Ọktoba, 1954 na Delta state dị na Nigeria
  • Ọ bụ onye agbụrụ Itsekiri
  • Ọ bụ onye dọkịta ahụike ma bụrụkwa ọkachamara n'ihe gbasara ọgwụ na-egbochi ahụ mgbu a kpọrọ 'anaesthesia'
  • Emmanuel Uduaghan gụrụ akwụkwọ na Mahadum Benin, ebe o nwetara nzere n'ihe ọmụmụ ahụike
  • Site n'afọ 1999 ruo 2003, ọ gara ozi dịka Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na Delta state n'oge ọchịchị Gọvanọ James Ibori
  • Site n'afọ 2003 ruo 2007, ọ bụụrụ odeakwụkwọ gọọmenti Delta state
  • Emmanuel Uduaghan bụụrụ gọvanọ Delta state site n'afọ 2007 ruo 2015 n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP)
  • Ọ hapụrụ PDP banye n'otu All Progressives Congress (APC) n'ọnwa Ọgọst, afọ 2018
  • N'ọnwa Septemba, afọ 2020, ọ laghachiri n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP)
  • Ka o ruru n'ọnwa Mee 2025, akụkọ kwuru na ọ laghachiri n'otu All Progressives Congress (APC) ọzọ
  • E nwetara ozi gbasara ọnwụ Emmanuel Uduaghan n'ụbọchị 19 Ọktoba, 2026, dịka akụkọ kwuru na ọ nwụrụ n'otu ụlọọgwụ dị n'Abụja
  • Ọ gbara afọ iri asaa na otu (71) tupu ọ nwụọ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị