Esi m n'ịgba ọkada banye n'ịkwọ ụgbọelu- Captain Callistus
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Chinonso Orji Nnachi
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Ifeanyi Callistus Kenechukwu a maara nke ọma dịka 'Captain Callistus' ekwuola na ya na-agbabu ọkada tupu ọ malite ịkwọ ụgbọelu.
Captain Callistus kwupụtara nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụ iche.
Na nkọwa ya, Captain Callistus kwuru na ya malitere ịnata ọzụzụ maka ịkwọ ụgbọelu n'afọ 2012 ma bido ịkwọ ụgbọelu e ji ebu ndị njem n'afọ 2017.
O kwuru na o nweghị mgbe ya nwere ebumnobi ịbụ onye ọkwọụgbọelu n'ihi na ezinaụlọ ya abaghị ọgaranya.
Mana o ruru n'ogogo ọ nọ taa site n'amara Chukwu nakwa site na ndị nọ ya n'akụkụ, dịka onye nwe ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace bụ Allen Onyema.
Captain Callistus kọwara sí, "Amụghị m n'obi ọgaranya. Oge m nọ n'ụlọakwụkwọ praịmarị, aga m eyigide 'knicker', ike ya akwọchaa. Onye lee anya n'azụ 'knicker' m ọ na-ahụ anya abụọ".
"Ọ dịghịrị m mfe mgbe m na-etolite, mana ihe na-agba m ume bụ na ọzụzụ ndị ahụ, ma ire ahụekere ma ịrụ kim-bom, ma igwu ọwa mmiri ma ịgba ọkada chịkọtara m ọnụ ka m bụrụ ihe m bụ taa."
Captain Callistus bụ nwaafọ Mbosi dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ihiala n'Anambara Steeti.
O kwuru na ihe kpalitere mmụọ ya iji olu Igbo na Pidgin na-ama ọkwa n'ime ụgbọelu bụ na mgbe ọ malitere ịkwọ ụgbọelu ma na-ebu ndị mmadụ ka ọ chọpụtara na ndị mmadụ kachasị aghọta ọkwa a na-amara ha ma ọ bụrụ na e wetuo ya n'olu asụsụ ha na-aghọta.
Captain Callistus kọwara sị,"Olu asụsụ anyị m na-ekwu okwu ya bụ Igbo, Awụsa, Yoruba na Pidgin nke onye niile nọ na Naịjirịa na-aghọta. Ọ na-eme ka obi ruo ndị mmadụ ala, maka na ụfọdụ mmadụ na-abụ ha gaa ịbanye n'ụgbọelu, ihe dịka ụbọchị atọ maọbụ anọ tupu njem, ha ga-anọ n'ekpere".
"Dịka ha na-abanye n'ụgbọelu, obi agaghị eru ha ala. Ha nọrọ ala n'ime ụgbọelu, ha anaghị anụ ihe ndị nlekọta ọha a na-akpọ 'cabin crew' nakwa ndị ọkwọụgbọelu na-ekwu. Ha na-ekwu n'ime obi ha sị,'ọ bụ gịnị ka anyị na-akọ. Ha na-arịọ Chukwu ka ụgbọelu felie ma fedata n'udo'.
"Oge m malitere ibu ndị mmadụ n'ụgbọelu ma ghọta na ọ bụrụ na m wetuoro ha ihe ahụ n'olu asụsụ anyị ma kọwaa ya n'asụsụ ha na-anụ ma ghọta, ọ ga-enye aka iwetu mmụọ ha ma mee ka ha nweta onwe ha nke ọma n'ụgwọ ha kwụrụ".
"Oge ahụ ka m jiri ghọta, mee nke mbụ, nke abụọ chọpụta na ọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ. Ọ na-abụkwa anyị fechaa n'elu, fetuo, ndị mmadụ na-ekele m maka iji olu asụsụ anyị."



