Ndị nwe ụlọọrụ njem ụgbọelu na Naịjirịa nwereike ịkwụsị ọrụ

Aha onyonyo, Ndị nwe ụlọọrụ njem ụgbọelu na Naịjirịa nwereike ịkwụsị ọrụ
Ndị nwe ụlọọrụ njem ụgbọelu na Naịjirịa nwereike ịkwụsị ọrụ

Ndị nwere ụlọọrụ njem ụgbọelu ekwuola na ha nwereike ịkwụsị ibu ndị njem gaa mpaghara Naịjirịa dị iche iche ma ọ bụrụ na gọọmenti emeghị ihe ọbụla iji belata ọnụahịa mmanụ ụgbọelu.

Onye kwuru nke a bụ Onyeisi ụlọọrụ njem ụgbọelu Air Peace bụ Allen Onyema.

Ka ọ dị taa, mmanụ ụgbọelu bụ Jet A1 a na-erebu ihe dịka narị naịra itoolu (N900) maka otu lita n'ọnwa Febụwarị, agbagoola ruo ihe dịka puku naịra atọ na narị naịra atọ maka otu lita ugbua.

Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Festus Keyamo gwara ndị ntaakụkọ sị na ọ bụ eziokwu na a kwaala ndị nwere ụlọọrụ njem ụgbọelu aka ọjọọ, ruo na nke ha agaghị enweike gaa n'ihu ma ọ bụrụ na ha ebulighị ụgwọ tiketi ha nwa obere oge.

N'izuụka gara aga ka ụlọọrụ njem ụgbọelu ndị e nwere na Naịjirịa yiri egwu ịkwụsị ọrụ, ma kwuo na nke ahụ abụghị atụmatụ iji chọọ mkparịtaụka, kama ọ bụ maka na ha agaghị agakwa n'ihu na-efe ụgbọelu ha n'ọnọdụ ọjọọ nke na-emetụta nchekwa na akụnaụba ha.

Nsogbu a na-abịa dịka agha dara n'etiti Ịran, Izrel na Amerịka, bụ nke kụsasịrị ịtụ mgbere mmanụ site ọwara mmiri dị oke mkpa e si atụ mgbere na mbaụwa bụ 'Strait of Hormuz' kemgbe ngwụcha ọnwa Febụwarị, ma mee ka ọnụahịa mmanụ rịa elu.

Ego ụgbọ dị icheiche na-aga elu kwa mgbe kwa mgbe na Naịjirịa, ọkachasị kemgbe agha Izrel na Iran malitere, mana sọọsọ nke a ka gọọmenti na-etinye ọnụ.