Eji m ịtụ crate ewepụ abụba n'ahụ m ka m ghara ibu ibu - Mmesoma Ezekiel (Crate girl)

Aha onyonyo, Eji m ịtụ crate ewepụ abụba n'ahụ m ka m ghara ibu ibu - Mmesoma Ezekiel (Crate girl)
Eji m ịtụ crate ewepụ abụba n'ahụ m ka m ghara ibu ibu - Mmesoma Ezekiel (Crate girl)
Mgbe e biputara ya

Nwada Mmesoma Ezekiel kwuru na o nwere mmasị ịtụ crate mmanya maka na ọ na-eji ya ewepụ abụba n'ahụ ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Mmesoma kwuru na ọ rụọ ọrụ ịtụ crate a ihe ruru afọ iri.

O kwuru na ego ọ na-enwete na ya nyeere ya aka ịzụta umu ururu ihe ndị o ji agụ akwụkwọ maka na ọ bụghị onye na-arịọ arịrịọ ego.

O kwuru na ọ na-akwọ kwa ụgbọala iji ekesara ndị ahịa ha mmanya ma bulata crate mmanya.

O kwuru na-agbanyeghi na ọ bụ nwaanyị na ihe ndị ahụ anaghị egbochi ya maọbụ mee ya ihere n'ọrụ ọ na-arụ.

Kirie ihe ndị o kwuru n'uju.