Kedụ ka El Niño ga-esi metụta ụmụafọ Nigeria?

Aha onyonyo, Dịka ụlọọrụ Climate Impact Lab wepụtara ozi na ihe ruru mmadụ 31,400 nwereike ịnwụ na Nigeria maka oke ekpomọkụ nke a kpọọrọ El Niño , Mana ọ bụ gịnị bụ El Nino?Nnyocha ụlọọrụ Climate Impact Lab mere kọwara na El Niño oke ekpomọkụ na-eme oge osimiri Central na Eastern Pacific bịara dị ọkụ ruo oge tere aka.N'agbanyeghị na osimiri Pacific a adịghị nso na Nigeria, oke ekpomọkụ sitere n'osimiri a na-emetụta ma na-agbanwe ikuku na-eku n'ebe dị iche iche n'ụwa.Nnyocha ụlọọrụ National Oceanic and Atmospheric Administration (NOAA) mere kwuru na El Niño na-eme kwa afọ abụọ maọbụ asaa ọbụla. Oge ọbụla o mere, o nwereike iru ọnwa itoolu maọbụ karịa.Ọ na-akwanye njọ n'ọnwa Disemba na Jenụwarị.E kwuru na Nigeria so na mba nwereike inwe nnukwu mmetụta El Nino. Mba ndị ọzọ o nwereike imetụta karịa bụ Indonesia na Sudan.
Kedụ ka El Niño ga-esi metụta ụmụafọ Nigeria?
Mgbe e biputara ya

Ụlọọrụ Nigerian Meteorological Agency kwuru na mmetụta El Nino nwereike imetụta mmiri ozuzo ma mee ka ebe niile na-ekpo ọkụ.

El Nino nwereike ibute oke idemmiri na Sokoto, Kebbi, Zamfara, Katsina nakwa ọtụtụ state ndị ọzọ na mpaghara ugwu Nigeria.

Oyo, Ogun, Osun, Ekiti, Edo na Delta state ga-enwe oke ekpomọkụ.

NiMet kwuru na nke a nwereike imetụta ndị ọrụ ugbo na state ndị a.

NiMet kọwara na El Nino nwereike imetụta ọkụ latrik n'ihi na mmiri ezughịoke n'ogige hydropower plant e ji emepụta ọkụ latrik.

El Nino nwereike imetụta ọnụahịa ihe oriri dị iche iche.

Maka etu ọ ga-esi metụta ahụike gị, Dọkịnta Eze Nwite dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla belata ịga ije n'anwụ ọkachasị n'elekere iri abụọ nke ehihe ruo elekere anọ nke gbede.

O kwuru ka onye ọbụla na-aṅụ mmiri etu o kwesiri ma kpọọ oku ka gọọmenti nakwa ụlọọrụ ahụike dị iche iche gbaa mbọ fesaa ozi nye ọhanaeze iji hụ na ha chekwara onwe ha.