You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu mwakpo ọbaozi INEC ga-esi metụta mpụtara ntuliaka 2027
Onye omee ejije a ma ama bụ Emeka Ike boro ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC ebubo iwepụta njirimara ya n'ụzọ iwu akwadoghị.
Ụlọọrụ INEC kwuru na ha amalitela ime nnyocha gbasara ebubo ịgba njirimara onye na-atụ vootu n'anwụ.
N'ozi nke ụlọọrụ Inec wepụtara n'ụbọchị Tuzde abalị abụọ nke ọnwa Juun, ka onyeisi ngalaba mgbasa ozi ụlọọrụ ahụ bụ Mohammed Haruna kwuru ihe a.
Cheta na Emeka Ike kwupụtara na ụlọọrụ ahụ nyere mmadụ ikike ịhụ njirimara ya dị n'ime ọbaozi Continuous Voter Registration (CVR) na iwepụta mpụtara ntuliaka imeụlọ ya nke o jiri ọkọlọtọ pati Nigeria Democratic Congress (NDC) wee zọọ maka ịga ụlọnnọchiteanya nke isi obodo Abụja.
Haruna kwuru na nnyocha mbụ ụlọọrụ ahụ mere egosila akantụ onye ọrụ ụlọọrụ ahụ e siri gbaa ozi mmadụ n'anwụ dịka o kwupụtara na ọ bụ naanị ndị ọrụ ya nwere ikike ịhụta njirimara ndị mmadụ dị n'ọbaozi ya.
O kwukwara na ụlọọrụ ahụ nyere ndị ọrụ ya ikike ahụ ka ha nweike idebanye aha ndị mmadụ chọrọ isonye na atụmụ vootu na ntuliaka 2027 na-abịa abịa dịka Continuous Voter Registration (CVR) na-aga n'ihu na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Kedụ etu nke a ga-esi metụta ntuliaka 2027?
Onye bụbu osote Onyeisiala Naịjirịa ma bụrụkwa onye ji ọkọlọtọ Afrịcan Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2027 bụ Atiku Abubakar, kpọrọ ụlọọrụ INEC oku ka ha mee ezi nnyocha dịka ha kwere na nkwa.
Atiku kwuru na nkwenye ụlọọrụ INEC na e si n'aka onye ọrụ ya nweta ozi ndị onye na-eme ntuliaka ma mechaa wepụta ya n'enweghị ikike ịgbasa ya egosila na nsugbo abụghị naanị mwakpo ọbaozi ụlọọrụ ahụ kama na ọ bụkwa nsogbu na onye ọrụ ụlọọrụ ahụ nwereike itinye aka na-imetọ usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Onye ma ihe ekwe na-akụ bụ ọkwaiwu Obulimba Madukaji gwara BBC News Igbo na ọ bụ ụdịrị ihe na-emezi n'ụwa ugbua dịka ọtụtụ ndị ntoroọbịa na-esi n'ụzọ ezighị ezi n'ịntanetị inwete njirimara ndị mmadụ maọbụ banye n'akantụ mmadụ.
O kwuru na omume a nwere nnkwu mmetụta banyere usoro ntuliaka ndị mmadụ na-atụ anya n'afọ 2027.
O kwuru na mmadụ nwereike itinye mpụtara ntuliaka adịgboroja n'ọbaozi nke ụlọọrụ INEC nke ga-eme ka ekwupụta onye abụghị ya meriri dịka onye nwetara mmeri.
O kwukwara na ihe ụmụafọ Naịjirịa chọrọ bụ ka ụlọọrụ INEC gba mbọ ịhụ na e nwere usoro ga-ahụ na atụrụ vootu, gụọ ọnụọgụgụ vootu nke ọma ma kpọpụta mpụtara ntuliaka ziri ezi.