Kedụ uru Aloe Vera bara n’ahụ mmadụ?

Aha onyonyo, Kedụ uru Aloe Vera bara n’ahụ mmadụ?
Kedụ uru Aloe Vera bara n’ahụ mmadụ?

'Aloe vera' bụ osisi ndị na-emepụta ọgwụ na nri ji emepụta ngwa eji elekọta ahụ, agwọ akpụkpọ ahụ kpọrọ nkụ ma na-ebelata ihe mgbu n'ime ahụ.

E jikwa ya arụpụta ihe ịchọ mma na nke e ji elekọta ntutuisi.

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ọgwụ kwuru na mmiri 'aloe vera' na-alọ alọ bụ 'mucilaginous gel' n'olu bekee bara uru n'ahụike mmadụ.

kedụ ihe ndị mejupụtara 'Aloe Vera'?

Osisi a nwere ụzọ akụrụngwa abụọ dị mkpa na-enye ọgwụgwọ. Nke mbụ bụ mmiri na-acha edo edo ma na-elu ilu nke bụ 'latex' n'olu bekee. Ọzọ bụ mmiri 'gel' na-alọ alọ.

Ndị ọkachamara kwuru na 'aloe vera' nwere ọtụtụ akụrụngwa mejupụtara ya gụnyere vitamin, mineral na amino acid.

Ọ bụ osisi jupụtara n'ihe na-alụso ọrịa ọgụ dịka vitamin A, C na E tinyere vitamin B12. Mineral dị n'ime ya gụnyere calcium, magnesium, zinc na ndị ọzọ.

Ọ na-emezị akpụkpọ ahụ site n'ịgwọ ọnya na ọkọ ọgbụgba, iwepụ otito na igbochi ịka nka.

Ọ na-enyere ahụ aka n'ịlụso nje 'bacteria' na 'virus' ọgụ.

Ọ dị mma iji sachaa ọnụ maka na ọ na-ebelata unyi eze maọbụ nje dị n'ime ọnụ.

Ọ na-enye aka ibelata oke shuga dị n'ọbara, ọkachasị maka ndị nwere ọrịa shuga, ma na-ebelata abụba ọjọọ ịmụba n'akwara.

O nwere ihe mmetụta ọjọọ dị na Aloe Vera?

N'agbanyeghị na 'aloe vera' bara uru n'ahụ mmadụ, o nwekwara mmetụta ọjọọ dị na ya.

Ndị ọkachamara kwuru na ụmụnwaanyị dị ime kwesịrị izere ya n'ihi na o nwereike ime ka nwa pụọ ma nwee ike ịkpalite afọ mgbu maọbụ afọ ọsịsa siri ike.

Ọ na ebute ọkọ na mgbakasị ahụ sitere n'ihe ndị ahụ mmadụ na-asọ nsọ bụ 'allergic reactions', o nwereike ịkpata ọrịa kansa ma mmadụ ṅụọ ya ogologo oge n'akwụsịghị akwụsị.

Ụmụaka na ndị nwere ọrịa akụrụ maọbụ imeju kwesịrị ị gbara 'Aloe Vera' ọsọ.

Ọ dịkwa oke mkpa ka ị jụọ dọkịta gị ma i nwere ọgwụ ndị ọzọ ị na-aṅụ.