Ihe mere m jiri chie echichi Eze ọdịnaala - Apostle Chibuzor Gift Chinyere
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Onyeisi ụlọụka Omega Power Ministry (OPM) nakwa onye eze ndị obodo Ikwuore dị n'Ọhanku Ndọkị n'Abịa Steeti akọwaala ihe mere o jiri nara echichi ọdịnaala n'agbanyeghị na ọ bụ ụkọchukwu a ma ama.
Eze Chibuzor Gift Chinyere nyere nkọwa a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche n'obieze ya.
Ụkọchukwu ahụ mere ka anyị mata na ọ bụ Chineke sịrị ya nabata echichi ahụ iji nweeike napụta ndị obodo ya.
"Ihe dịka afọ 10 gara aga, eze anyị nwụrụ nke mere ka anyị ghara inwe eze. Ndị na-echi eze bịakwutere m, m sị ha mba, mana ha gara n'ihu gbaa isi akwara. Dịka ha gara n'ihu na-esi ọnwụ, amalitere m itinye ya n'ekpere".
"Onye nwe anyị gwara m sị "ana m eziga gị dịka Moses ka ị gaa napụta ndị m." Ọ bụ etu ahụ ka m siri nabata ya ihe dịka afọ abụọ gara aga," ka Eze Chibuzor kọwara.
Eze Chibuzor kọwakwara etu o siri kwụsị ịtụ mmanya n'obodo ya ma mee ka ndị dibịa kwụsị ịrụ ọrụ.
"Ihe mbụ m mere oge echiri m eze bụ na m kwuru na agaghị atụ mmanya, maka na ị gaghị enwe nna ukwu abụọ n'otu oge. Ịtụ mmanya bụ ịkpọlite mmụọ ndị nnanna anyị, ọ bụ omume ekwensu".
"N'ụbọchị mbụ n'ọnwa ọhụrụ ọbụla, o nweghị onye na-aga ahịa, o nweghị onye na-aga ugbo. Onye niile na-agbakọ n'obieze, anyị ekpee ekpere".
"Kemgbe afọ abụọ maọbụ atọ gara aga ka m kwụsịrị ndị dibịa ọrụ, maka na ha na-eme ọtụtụ arụ. Ha na-enye ndị mmadụ ọtụmọkpọ maka iji zuo ohi ma mee ihe ọjọọ ndị ha na-eme. Akwụsịrị m ha niile ọrụ ma kwalite ha".
"O nweghị onye ọbụla n'ime ha nyere mkpesa. Ugbua, ha niile na-eme ihe dị iche iche, ma ha na-emekwa nke ọma na ya. E nweghị otu onye dibịa n'obodo m ugbua," ka o kwuru.



