Oge ụmụaka obodo m dara ule ‘Jamb’ n’igwe ka m bidoro ịkwalite mmụta – Alex Onyia

Aha onyonyo, Oge ụmụaka mba m dara ule ‘Jamb’ n’igwe ka m bidoro ịkwalite mmụta – Alex Onyia
Oge ụmụaka obodo m dara ule ‘Jamb’ n’igwe ka m bidoro ịkwalite mmụta – Alex Onyia
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Orji Nnachi
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
  • Mgbe e biputara ya

Alex Onyia, bụ onye nka kọmputa Bekee kpọrọ 'software engineer' doro anya nakwa onye na-akwado agụmakwụkwọ bụ onye hiwere asọmpi 'South-East Mathematics Olympiad' na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Onyia bụkwa onye duu ndị meriri ma ritere Nigeria nturugo na mba Rome na nso nso a, kọwara BBC Igbo etu ije ya siri malite.

Onyia kwuru sị, "Ihe kpatara m ji guzowe asọmpi South-East Mathematics Olympiad' bụ na Maths bụ ihe ọmụmụ agụmakwụkwọ onye ọbụla kwesịrị ịma maka ya.

Onyia bụ onye pụtara ihe n'afọ 2025 oge ọ kpọrọ oku ka ụlọọrụ na-ahụ maka ule e ji abanye ụlọakwụkwọ mahadum na Nigeria bụ 'Jamb' lebanye anya n'usoro e si ahazi ule Jamb afọ ahụ dịka ọtụtụ na-atụ uche na e nwere ndahie nke akụrụngwa e ji hazie ya nke mere ka ihe ruru pasent 80 ụmụakwụkwọ jiri daa ule ahụ.

Na mkparịtaụka pụrụiche nke ya na BBC Igbo nwere, Onyia kọwara etu ụlọọrụ ya si mata na Jamb mere ndahie ma tiwe mkpu bụ nke mere ka Jamb mee nnyocha ma kwupụta n'ezie na e nwere ndajo si n'aka ụlọọrụ ha, ma hazie ule mgbakwụnye maka ndị o metụtara.