Gịnị mere e ji enyocha Mark Okoye bụ onyeisioche SEDC?

Aha onyonyo, Gịnị mere e ji enyocha Mark Okoye bụ onyeisioche SEDC?
Gịnị mere e ji enyocha Mark Okoye bụ onyeisioche SEDC?
Mgbe e biputara ya

Kọmiiti ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa na-ahụ maka ụlọọrụ South East Developement Commission (SEDC) nke Sinetọ Ojir Uzor-Kalu nọ n'isi ya, nọrọ n'ụbọchị Tuzde abali itoolu nke ọnwa Juun, 2026, gbaa onyeisioche ụlọọrụ SEDC bụ Mark Okoye ajụjụ banyere ihe ụlọọrụ ya ji ego gọọmenti etiti nyere ha mee.

Cheta na gọọmenti kwadoro ego dị ijeri iri isii na nde isii (16.6bn) dị na mmefu ego bọjeti afọ 2025 nke ụlọọrụ SEDC ga-eji rụọ ọrụ n'afọ ahụ.

N'ọgbakọ ahụ SEDC na kọmiiti ahụ nwere n'ụbọchị Tuzde, Orji Uzor Kalu gwara Mark Okoye ka ọ kọwaa ihe mere ụlọọrụ ya ji kwụọ otu narị nde naịra na iri ise (N153m) maka iji nweta ụlọọrụ n'Abuja ma kọwaa ihe ha ji ijeri naịra abụọ na nde naịra ise (2.5bn) nke ha kpọrọ "implied expenditure n'olu bekee mee.

Kalu kwukwara na nchọpụta komitti ya mere gosiri na ọ bụ naanị ijeri narịa iri na atọ (13bn) fụdụrụ n'ego SEDC dị n'ụlọakụ etiti Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka kọmiiti ahụ malitere ime nnyocha n'ego ụlọọrụ SEDC mefuru nakwa ihe ha ji ya mee.

Ụfọdụ ndị otu kọmiti ahụ gụnyere Sinetọ ndị na-anọchịteanya mpaghara dị iche iche n'ọwụwaanyanwụ Naịjirịa dịka Sinetọ Victor Umeh, Sinetọ Enyinnaya Abaribe nakwa Sinetọ Austin Akonundu, kọwara mwute ha ma katọ nkọwa SEDC nyere banyere ego ha mefuru.

Mana akwụkwọ ozi SEDC wepụtara kọwara na ụgwọ ụlọọrụ ahụ ha kwụrụ n'Abuja bụ iji nwee ebe ha ga-anọ enwe ụfọdụ ọgbakọ ma kwuo na otu narị nde naịra na iri isee (N153m) ahụ gụnyere ụgwọ ụlọ ahụ nakwa ụgwọ ihe ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ n'ụlọọrụ ahụ kemgbe e hiwere ụlọọrụ SEDC n'ụbọchị iri n'otu nke ọnwa Febụwari 2025.

Banyere ijeri naịra abụọ na nde naịra ise (2.6bn) ahụ a kpọrọ 'implied expenditure', SEDC kwuru na ego ahụ bụ maka iji dozie ụlọ gọọmenti Enugwu steeti nyere ha ka ha jiri mee isiụlọọrụ ha.

O kwuru na ha rubere isi nye usoro iwu kwadoro tupu ha amapụta ego ahụ maka iji ya rụọ ọrụ.

Ka ọ dị ugbua, kọmiti ahụ gara n'ihu gwa ndịisi SEDC ka ha bịaghachi n'ụbọchị Tuzde abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Juun 2026.

A gwara ha ka ha weta akwụkwọ ndekọ na nkọwa zuruoke banyere ego niile ha mefuru nakwa ihe ha ji ego ndị ahụ mee.

Cheta na Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu hiwere ụlọọrụ SEDC n'afọ 2025 ma nye ha iwu ka ha depụta, chikọba ma malite mmepe alaigbo nke emebeghị ka mgbe agha kwụsịrị na afọ 1960.

SEDC ji aka ha wepụta atụmatụ kwuru na ha ga-arụ ihe niile ha kwadoro site ugbua ruo n'afọ 2050.

Ha kwuru na ihe ha ga-eji malite gụnyere, ịrụ ezigbo okporoụzọ, inye ọrụ, ịkwado azụmahịa, ịrụgasị akwammiri, imepe ebe ọdọ ụgbọmmiri dị n'Ọnịcha, ụzọ ụgbọoloko na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.