Nkọwa ụka Katọlik banyere ịmụta mmadụ na mmiri chukwu
Nonye Soludo bụ nwunye Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra state, ekwuola kpọm kwem na Peter Obi abụghị nna mmirichukwu ụmụaka ha.
Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo fesara na soshal midia ebe Peter Obi kwuru na ya na ezinaụlọ Gọvanọ Charles Soludo nwere ezi mmekọ ma kwuo na ya bụ nna mmiri chukwu ụmụaka Gọvanọ Soludo.
N'ozi ọnụ na-ekwuru Nonye Soludo bụ Daniel Ezeigwe wepụtara, o mere ka o doo anya na okwu ahụ Peter Obi kwuru abụghị eziokwu ma kwuo na ọ bụ Nonye Soludo bụ nne mmiri chukwu nwa nwaanyị Peter Obi.
Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na nwunye Peter Obi bụ Margret Obi bụ nne mmiri chukwu otu nwa nwaanyị Gọvanọ Soludo.
Ọ kọwara na Peter Obi maọbụ Gọvanọ abụghị nna mmiri chukwu nye ụmụaka ha ọbụla.
Mana ọ bụ gịnị bụ nkụzi ụka Katọlik banyere ịmụta mmadụ na mmiri chukwu nke Bekee kpọrọ 'godparents?
Fada Benjamin Achi nyere anyị asịsa ajụjụ a oge anyị kpọrọ ya n'ekwentị.
SOT
Mana ọ bụ gịnị bụ nkụzi ụka Katọlik banyere ịmụta mmadụ na mmiri chukwu nke Bekee kpọrọ 'godparents?
Fada Benjamin Achi nyere anyị asịsa ajụjụ a oge anyị kpọrọ ya n'ekwentị.
Fada Benjamin kwuru na dịka ọ dịrị di na nwunye ịmụta nwa, ọ bụkwa etu ahụ ka o dị n'ịmụta mmadụ na mmirichukwu.
O kwuru na ọ bụrụ na nwoke lụọ nwaanyị, ha abụọ abụrụla otu ndị. Nke a pụtara na ọ bụrụ na di nwaanyị maọbụ nwunye nwoke mụta mmadụ na mmiri chukwu, ihe ọ pụtara bụ na ha abụọ bụ nne na nna onye ahụ a mụtara na mmiri chukwu.
Cheta na Gọvanọ Soludo na-ebu Peter Obi ebubo na o ji ndị ọrụ akatamkpo ego oge ọ bụ Gọvanọ steeti ahụ.



