Rabiu Kwankqwaso: Ọ dịghị njọ ịnabata ndị Boko Haram chegharịrị echegharị

Rabiu Kwankqwaso: Ọ dịghị njọ ịnabata ndị Boko Haram chegharịrị echegharị
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Onye dere ya, Abba auwalu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Onye ga-efe ọkọlọtọ otu NDC maka ọkwa Osote Onyeisiala bụ Rabiu Kwankwaso atụọọla arịrị n’ihi ndakpọ ọnọdụ nchekwa na akụnaụba Naịjirịa n'ọchịchị APC.

Kwakwanso, aka chịburu Kano steeti, kwuru na aka chịburu Naijiria bụ Muhammadu Buhari gbara ọnyụpa n' ibu agha megide nsogbu nchekwa n’ihi na ọ chịkọtaghị alaka dị iche iche na nke ndị ọrụ nchekwa ka ha na-arụ ọrụ dịka otu ezinaụlọ.

“Anyị kwadoro Buhari n’afọ 2015 mana Buhari wụrụ anyị n’ala. Echetara m n'afọ 2015 aka m bụ Gọvano Kano. Enwetara m vootu nye Onyeisiala Buhari nke kachasị nke onye ọbụla, vootu m nyere ya ruru ijeri abụọ.

"Ihe anyị na-atụ anya n'aka ya, rịrị arị mana ọ wụrụ anyị n'ala. Anyị amaghị na ọ bụ etu ahụ ka ọ ga-esi aga.”

Ọ rụtụrụ aka n’ọchịchị APC ugbua . Ọ sị na Bola Tinubu ka na-eri mperi n’atụmatụ nchekwa.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, o kwuru na ihe akawanyela njọ site n’etu ọ dị bụ nke na ụfọdụ na-akpọ oku ka aka chịburu Naijiria bụ Goodluck Jonathan lọghachite n’ọkwa Onyeisiala.

Kwankwaso , onye kwuru na Buhari wụrụ ọtụtụ ndị kwadoro ya n’afọ 2015 n'ala, kwuru na Onyeisiala Bola Tinubu na-aga n’ihu na-ewetara ụmụ Naijiria agụụ na ahụhụ.

Mana ọ kwadoro usoro ịgbaghara ndị oyinduegwu chegahrịrị echegharị.

Kirie ihe o kwuru n’uju n'ebe a: