“Achọrọ m ka ICC nyocha mwakpo Xenophobia mere na Saụt Afrịka” - Emmanuel Kotin
Emmanuel Kotin na Palgrave Boakye-Danquah bụ ụmụafọ mba Gana agbala mba Saụt Afrịka akwụkwọ n'ụlọikpe mbaụwa bụ International Criminal Court (ICC) maka mwakpo ndị Saụt Afrịka wakporo ndị si mba Afrịka dị iche iche nọ na mba ha na nso nso a.
Ha na-akpọ oku ka ụlọikpe ICC mee nnyocha zuru oke banyere mwakpo ahụ nakwa ajọ agwa ụmụafọ Saụt Afrịka mesoro ndị mba Afrịka ndị ọzọ.
Oge BBC gbara Emmanuel Kotin ajụjụọnụ, ọ katọrọ ihe ọ kpọrọ "ajọ agw" ụmụafọ Saụt Afrịka ma kwuo na Onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa gbara nkịtị ewu a mụọ n'ọgbụrị.
Ọ gara n'ihu kọwaa etu mwakpo ahụ si metụta ọtụtụ ụmụafọ Afrịka si ebe dị iche iche.
Cheta na mwakpo Xenophobia e mere megide ndị mbịarambịara sị Afrịka bata Saụt Afrịka n'ụzọ megidere iwu, mere ka ọtụtụ mba Afrịka gụnyere Naịjirịa, Gana, Kenya, Malawi, Mozambik nakwa Yuganda malite ịkpọlata ụmụafọ ha ndị kwuru na ha chọrọ ịhapụ Saụt Afrịka.
Palgrave Boakye-Danquah na Emmanuel Kotin kwuru na ebumnobi ha bụ ka ụlọikpe ICC ahụ dị na Hague mee nnyocha banyere mwakpo nakwa mmekpa ahụ ụmụafọ mba Afrịka mekpara ụmụ Afrịka ndị ọzọ iji gbochie ụdịrị ihe ahụ ime n'ebe ọzọ n'ọdịnihu.






