Ndịagha pụrụiche e gburu omee nnyocha Mathipa n'ihi onye ISIS a na-enyo enyo?

Aha onyonyo, Ndịagha pụrụiche e gburu Mathipa n'ihi onye IS a na-enyo enyo?
Ndịagha pụrụiche e gburu omee nnyocha Mathipa n'ihi onye ISIS a na-enyo enyo?
Mgbe e biputara ya

BBC Africa Eye enwetala akwụkwọ ndị uweojii a na-ahụbeghị mbụ na ihe akaebe pụrụ iche kpughere eziokwu ọhụrụ banyere ogbugbu otu n'ime onye ọrụ nnyocha kacha elu na Saụt Afrịka.

E gburu Frans Mathipa mgbe ọ na-enyocha ofufu Abdalla Abadigga, onye e boro ebubo na ọ bụ onye otu na-eyi ndụ egwu bụ Islamic State nwere ọtụtụ amamihe banyere otu ahụ.

A ga-ekpe mmadụ asaa n'ime ndịagha pụrụ iche na otu onye ọzọ ikpe maka ogbugbu Mathipa. N'ime ha, a na-ebo mmadụ asaa ebubo, tinyere mmadụ anọ ndị ọzọ, maka ịtọrọ ma gbuo Abadigga. Ha gọnarịrị ebubo ndị ahụ.

Akụkọ kwuru na e ji nzukọ adigboroja ghọgbuo Frans Mathipa ka ọ bịa ebe e ji ụgbọala yiri nke Saụt Afrịka Special Forces malite ịchụ ụgbọala ya, tupu a gbagbuo ya.

Mathipa na-enyocha etu Abdella Abadigga si fuo, bụ onye a na-enyo enyo so n'otu na-eyi ọha egwu IS e boro ebubu na ụlọọrụ Department of Home Affairs zubatara na mba Saụt Afrịka.

Abadigga furu efu na Dizemba afọ 2022 ma ka onwa olemole gachara, omee nnyocha malitere ọrụ na-enyocha ya, o wee rie isi ya.

Gịnị ka ndị uweojii kwuru?

Ndị uweojii sị na ndị ụlọọrụ Special Forces gara n'ihu na-amaja ndị nnyocha n'agbanyeghị ọnwụ Mathipa.

Ụlọọrụ Department of Home Affairs nakwa ụlọọrụ National Defence na Saụt Afrịka azaghị ajụjụ BBC gbasara okwu a.