Ihe ndị na-eme ejije kwuru maka nturuugo AMVCA afọ 2026
Ndị ama ama n'ihe nkiri gbakọtara na Legọs steeti maka agba nke iri na abụọ nke emume 'Africa Magic Viewers' Choice Awards' (Amvca), iji gosi na Naịjirịa ka bụ ọkaibe n'ihe gbasara ejije na ihe nkiri.
Ọtụtụ ndị na-eme ihe nkiri na ndị ama ama bịara ọgbakọ ahụ gosipụtara nnukwu nka na mmepụta dị n'Afrịka site na uwe ha yie na ụdịrị ejije ndị ha megoro.
Ndị dịka Uche Montana, Uzor Arukwe, Bucci Franklin, Linda Ejiofor na Kanayo O. Kanayo turu ugo dị iche iche n'emume nke afọ a.
Ọtutụ ndị ejije ọzọ a ma ama dịka Stan Nze gwara BBC News okwu banyere emume ahụ na etui me ejije na ihe nkiri sin a-eto na Naịjirịa na mpaghara Afrịka niile.
Stan Nze kọwara na emume ahụ bụ iji nye ndị merela ejije nke ọma onyinye nkwanyeugwu iji sị ha daalụ.
O kwuru na uwe ya yi mere ya dịka onye Afrịka, ma dịkwa onye yi uwe 'suit'.
"A nọ na-ahazi ya kemgbe, ọ bụ n'ụtụtụ a ka a kwachara ya. Ị ga-achọ enyemaka otu obodo tupu i yiri ya, ma ọ ga-amasị m ka m si n'ime ya pụta na-egbughị oge," ka o kwuru.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Onye ọzọ na-eme ihe ejije bụ Onochieze Nelson kwuru na a họpụtara ụfọdụ ndị enyi ya maka inye ha onyinye nkwanyeugwu gbasara imepụta ihe nkiri nakwa ejije ndị ha mere.
O kwuru na ndị ahụ gụnyere Soso, Kanaga ma gaa n'ihu kwuo na ya na-arịọ Chineke ka ha merie, ka ya nweekwa ike rigoro na nkwago soro ha ṅụrịa ọṅụ.
Na mgbakwunye, Stan Nze kwuru na o teela aka ha malitere, n'eziokwu.
"Oge agaala mgbe ndị mmadụ na-ekwu na ha anaghị ekiri ejije ndị Naịjirịa. Anaghịzi m eji ike anụ ya ugbua, maka na ogogo ya agbagoola n'ebe ọ dị ukwuu. Onyonyoo, ụda, akụkọ, odide akụkọ, nke kasị nke bụ na ọ bụzi akụkọ ndị metụtara anyị ka anyị na-akọ ugbua, ma echere m na ọ bụ ihe ndị a ka anyị kwesịrị ime iji bugoo ngalaba ụlọọrụ anyị. Ị gaghị abụ onye ọcha karịa onye ọcha n'onwe ya," ka ọ kọwara.



