"Egwu m na-eti bụ ọnatarachi nke si n'aka nne na nna m fee m"
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Chinonso Orji Nnachi
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Otiegwu ọdịnaala Igbo a ma ama bụ Queen Theresa Onuorah ekwuola na egwu ọ na-eti bụ onyinye pụrụiche nke ọ natara Chi site n'aka nne na nna ya.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, nwada a e ji egwu a kpọrọ 'Egedege' maara kwuru na nne na nna ya tiri egwu, na ọ bụ n'aka ha ka iti egwu si rute ya n'aka.
O kwuru na ọ malitere iti egwu n'afọ 1974 bụ mgbe o tiri egwu mbụ ya nke a kpọrọ "onye akpala nwa oke", ma mechaa tie egwu ya nke gbapụtara ihe nke ukwuu a kpọrọ "Ijele eruwego" n'afọ 1980.
O kwuru na egwu 'Egedege' bụ egwu ọnwa ha tiri mgbe ha bụ ụmụaka, kwuo na ọtụtụ ndị na-akpọ ya ihe dị iche iche.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ya nyere egwu ọ na-eti aha 'Egedege' dịka Chineke si kpugheere ya aha ahụ.
O kwuru na oge ọ na-eti egwu na ndị dịka Christiana Essien, Onyeka Onwenu, Nelly Uchendu na ndị ọzọ tikwara egwu mgbe ahụ,
Nwada a bụ nwaafọ Unubi dị na Nnewi South nke Anambara Steeti kwuru na obi dị ya ụtọ etu egwu o tiri kamgbe ihe karịrị afọ iri anọ si malite iwu ọzọ site n'enyemaka ndị otiegwu bụ Larry Gaga, Phyno na Flavour bụ ndị ha na ya kụgharịrị egwụ ahụ ọzọ na nso nso,
O kelere ndị a ma sị ka Chineke gọzie ha nke ọma.
Ezenwaanyị Egedege kwuru na ọ bụghị naanị egwu ka ọ na-eti, na ọ na-akwa akwa ma na-emekwa isi kama na nke kachasị agara ya aka bụ iti egwu nke mere o jiri hapụ ndị ọzọ ahụ.
O kwuru na ọ ga-amasị ya ịhụ ka ụmụagbọghọbịa ọgbara ọhụrụ a na-eti egwu ọdịnaala Igbo dịka ha si tie n'oge nke ha.
Kama ka onye ọbụla tie site na ntuziaka na onyinye Chineke nyere ya, na-abụghị ịkọrọ ụdịrị egwu onye ọzọ na-eti.
Ọ gakwara n'ihu dọọ aka na ntị ka ndị na-eji aha ya na-aghọrị ndị mmadụ na soshal midịa kwụsị ya.
Kirie ihe o kwuru n'uju;



