Olu of Warri: ‘Adị m ka nwaanyị atọ nye di m’ - Olori

Aha onyonyo, Nwunye Olu of Warri: Adị m ka nwaanyị atọ nye di m
Olu of Warri: ‘Adị m ka nwaanyị atọ nye di m’ - Olori
Mgbe e biputara ya

Na mkparịtaụka BBC Pidgin na nwunye Olu nke Warri bụ Olori Atuwatse 111 nwere ọ gbara ama na di ya achọghị ilu nwaanyị ọzọ.

Mana ọ rụtụrụ aka na ihe na-ewute ya karịa bụ na ndị ya anaghị enwe ohere kama ọtụtụ ihe ọ na-eme mere na ọ naghị enwe ohere maka ya etu o siri chọọ.

Aha onyonyo, Nwunye Olu of Warri: Mmụta na ihe mkpọbiụkwụ dịịrị ụmụnwaanyị Africa

Nwunye Olu nke Warri bu Olori Atuwatse 111 akọwala ndọnị ụmụnwaanyị Africa na-adọnị iji welite isi n'ehe a na-eme.

Na mkparitaụka ya na BBC Pidgin nwere na nsonso a, "E nwere echiche a na-enwekarị na nwanyị kwesịrị ịnọ naanị n'ụlọ, na kichin, ma ọ bụ na ọrụ ya kacha mkpa bụ ịlụ di.

Ma n'eziokwu, e nwekwara ọtụtụ ihe mgbochi dị n'èzí na-egbochi ụmụ agbọghọ na ụmụ nwanyị imezu ike ha."