Ugwu na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa kwerịrị ịgbaghara onwe ha -Kwankwaso

Aha onyonyo, Ugwu na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa kwesrịrị ịgbaghara onwe ha - Kwankwaso
Ugwu na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa kwerịrị ịgbaghara onwe ha -Kwankwaso
Rabiu Kwankwaso, aka chịburu kano steeti dịka o nye uwe ọcha na okpu mmemme
Mgbe e biputara ya

Onye so Peter Obi azọ ọkwa ọchịchị dịka Osote Onyeisiala na ntuliaka 2027 n'aha otu NDC bụ Rabiu Kwankwaso akpọọla oku ka ndị Ugwu na ndị Ọwụwa Anyanwụ gbaghara onwe ha ma jikọọ aka maka ọdịmma Naịjiria.

Kwakwaso onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere an snosno a kwuru na Ugwu Naijiria na Ọwụwa Anyanwụ bụ enyi kemgbe malite n'oe Nnamdi Azikiwe.

Ọ sịrị, "Anyị kwenyere na Ọwụwa Anyanwụ bụ ndị enyi anyị kemgbe. N'ọchịchị ndị nkịtị mbụ, NPC bụ pati ndị Ugwu na NCNC nke Nnamdi Azikwe bụ onye ndu ha nwere nkwekọrịta. Ọbụladị n'agba nke abụọ nke ọchịchị ndị nkịtị, Shagari na ndị otu ya na ndị Ọwụwa anyanwụ nwere nkwekọrịta."

Aka chịburu Kano steeti gara n'ihu sị, "Anyị agaghị anọ n;out obodo na-ebu onwe anyị agha. Anyị kwesịrị inwe mmụọ ịgbaghara onye ọbụla mejọrọ anyị."