Iko bọọlụ agbanweela ndụ m n'ụzọ dị iche iche - Evelyn Okafor
Onye na-eko bọọlụ bụ 'freestyle football' a ma ama bụ Evelyn Okafor agwaala BBC News etu o si malite ije ya n'egwuregwu 'freestyle football'.
Na mkparịtaụka pụrụ iche ka Okafor kwuru na egwuregwu 'freestyle football' bụ nnukwu ihe nyere ya.
O kwuru na: "Ọ bụ olileanya, igosipụta nkà na nnwereonwe maka na oge m chọrọ ịgbahapụ egwuregwu, o nyere m olileanya ịga n'ihu ime egwuregwu. Ahụrụ m egwuregwu a n'anya maka na ọ pụrụịche ma dịkwa ụtọ."
Dịka o siri kwuo, ọ malitere egwuregwu 'freestyle football' oge o nwere mmerụahụ n'ikpere site n'ịgba bọọlụ.
"Oge m gbakere ka m chọpụtara 'Freestyle football' n'ịntanetị. Ọ tụrụ m n'anya na e nwere ụdịrị egwuregwu ahụ na Naịjirịa," ka o kwuru.
Okafor gara n'ihu kwuo na o nweela ọtụtụ oge ya chọrọ ịkwụsị ma jụọ onwe ya onye zigara ya mewe 'freestyle football'.
O kwuru na nke ahụ akwụsịghị ya ma kwuo na ọtụtụ ihe mkpọbiụkwụ dị mana ọ gara n'ihu na-anwa ike ya.
"N'ikwu eziokwu, egwuregwu 'freestyle football' agbanweela ndụ m n'ụzọ dị iche iche. O nyela m ohere izute ọtụtụ mmadụ, ma gaa mba ofesi. Nke ahụ bụ nnukwu ihe nyere m. Ị maara, ihe gbasara ego. Oge ụfọdụ a na-ahọrọ m maka ịgbasa ozi ngwaahịa nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ metụtara egwuregwu. Ya mere, ọ gbanweela ndụ m," ka ọ kọwara.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Okafor kwuru na bụrụla onye a ma ama, nke pụtara na ndị mmadụ matara ya dịka onye na-eme 'freestyle football' oge e mechara egwuregwu n'afọ 2019 site na soshal midịa.
"Ọ masịrị ndị mmadụ nke mere ka ndị nkụzi mahadum mụ amaghị malite ịjụ ma ọ bụ m bụ Okafor. Nke ahụ nyere m obiụtọ," ka o kwuru.
O kwukwara, "Obi tọrọ m ụtọ ịbụ nwaafọ Afrịka mbụ ga-etozu oke maka ịmaaka na mbaụwa, maka na oge ụfọdụ, m cheta ya, ọ dị m ka ọ bụ na nrọ. Mana m kpọlaa echiche azụ gbasara etu m si malite nakwa ebe m si pụta, m nwee obiụtọ ma na-emekwa nganga n'ihi na ọ dịghị mfe. Abụ m nwata ahụ na-ekwenyeghị maọbụ hụ onwe m dịka onye ga-agate aka n'egwuregwu 'freestyle football'. Ya mere, ọ bụ ihe ọṅụ."
Kirie ya n'uju ebe a.



