Fifa agbanweela iwu ha iji nabata otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị mba Afghanistan
Otu na-ahụ maka egweregwu bọọlụ n'ụwa a kpọrọ Fédération Internationale de Football Association (Fifa) agbanweela iwu ha iji nabata otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị mba Afghan a chụpụrụ.
Nke a bịara dịka Taliban machiri egwuregwu nwaanyị n'afọ ise gara aga.
Mursal Sadat bụ onye na-agba azụ na Osote onye ndu kwuru na 'Cheta na n'ọnwa Ọgọst 2021, ọdọụgbọelu aadịghị ka ọdọụgbọelu.'
Oge mụ na nne m gara nọ ọnụ ụzọ mbụ, ha tụdoro anya egbe ma jụọ m, kedụ di gị?
Ọ bụ ebe ahụ ka obi nọ gbawaa m, echere m na ihe niile abịala n'isi njedebe. Achọrọ m iji ohere a kpọọ oku maka ụmụnwaanyị mba Afghanistan e gbochiri ịga ụlọakwụkwọ kemgbe afọ ise gara aga.
Eziokwu bụ na akwụkwọ, okoko rose, onye na-achiteanya na ọkọlọtọ, nakwa ụbọchị ahụ bụ Ọgọst 15.
Oge ọbụla m hụrụ onwe m n'ajọ ọnọdụ Ana m eche maka ya ma kwuo'Nwaanyị, ugbua, ịbụ olileanya nye nye ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ n'ụlọ, ya mere, a dala mba.'
Ndị ọgbaabọọlụ a ka machara asọmpi mba ha kemgbe iwu ahụ gbanwere na mba New Ziland ji 13,000km tee aka.
N'oge adịghị n'afọ a, ha ga-achọpụta ka etozuru isonye n'out egwubọọlụ ahụ. Ọ bụrụ maka m, ebe ọbụla e nwere ama egwuregwu bọọlụ e nwere bọọlụ, m nwee ike ịgba, ọ na-adị m ka m anọ n'ụlọ.
Ọ bụ naanị ebe a ka ọ na-adị m ka m anọ n'ụlọ. Otu, abụọ, atọ, Afghanistan!



