Ndị niile nyere Adeyemi aka hiwe ụlọọrụ PFIPC kwesịrị inweta ntaramahụhụ - ICPC
Gịnị bụ ntaramaahụhụ nwereike ịdakwasị ndị nyeere Adeniyi Adeyemi hiwe ụlọọrụ gọọmenti adịgboroja?
Eji m aka na ị nụla na ụlọọrụ Independent Corrupt Practices and other Related offense Commisiion (ICPC) kwuru na nnyocha ha mere chọpụtara na ụlọọrụ Presidential Foreign Investment Promotion Council (PFIPC) nke Adeniyi Adeyemi hiwere ma bụrụ onyeisi bụ ụlọọrụ adịgboroja.
ICPC kwuru na akwụkwọ ọrụ ahụ bekee kpọrọ appointemet letter Adeyemi ji akpagharị bụ akwụkwọ ọrụ adịgboroja n'ihi na enweghị oge ọbụla obi ọchịchị gọọmenti Naịjirịa jiri hiwe ụlọọrụ ọbụla a kpọrọ PFIPC, nye Adeyemi ọrụ maọbụ họpụta n'ọkwa ọbụla.
Nchọpụta ndị a ICPC chọpụtara na-abịa dịka Onyeisiala Tinubu nyere ICPC iwu ka ha mee nnyocha zuruoke iji mara ebe mmiri si baye n'opi ọgbọgọrọ kemgbe akụkọ Adeyemi na ụlọọrụ adịgboroja a pụtara ihe na nso nso.
Ihe ọzọ dị mkpa mpụtara nnyocha ICPC mere kwuru bụ na, Adeyemi hụrụ na usoro e ji eme nnyocha banyere akwụkwọ ọrụ nakwa mmekọ dị n'etiti ụlọọrụ gọọmenti dị iche iche na-eri mperi, ma jiri ohere ahụ tinye akwụkwọ ọrụ adigboroja ahụ ma nweta ụfọdụ nkwado o ji hiwe ụlọọrụ adịgboroja ahụ.
ICPC kọwara na Adeyemi hiwere ụlọọrụ gọọmenti adịgboroja abụọ ọzọ aha ha bụ FCT Investment Promotion Agency (FIFA) nakwa Foreign Investment Promotion Agency and Public Private Partnership (FIFA-PPP).
Mana e nwere ndị nyeere Adeyemi aka hiwe ụlọọrụ adịgboroja ndị a?
Ọkaiwu Jide Ologun kwuru na enweghị ka ọ ga-esi bụrụ naanị Adeyemi kpara nkata ma hiwe ụlọọrụ adịgboroja ahụ ma kpọọ oku ka e mee nnyocha iji chọpụta onye maọbụ ndị ọbụla nyeere ya aka maọbụ kwado ya n'ụzọ ọbụla, ma nye ha ntaramahụhụ zuruoke dịka iwu si kwuo.
Ọkaiwu Ologun kwuru na ọ bụrụ na i lee anya n'etu Adeyemi si kpaa agwa nakwa ụfọdụ ihe o mere nke gụnyere ikwu na o nyere Femi Gbajabiamila bụ onyeisi ọrụ Onyeisiala aka azụ iji nweta ọkwa ahụ, inweta ụlọọrụ n'ogige Federal Secratariat Abuja, inweta akara ụlọakụ CBN, ịchịkọba ọgbakọ dị iche iche n'etiti ya na ndị si mba ofesi, inweta akara ụgbọala onye ọrụ gọọmenti nakwa ihe ndị ọzọ, gosiri na e nwere ndị nyere ya nkwado
Ọkaiwu Ologun mere ka o doo anya iwu Naịjirịa karịrị onye ọbụla ma kwuo na e kwesịrị inyocha Femi Gbajibiamila bụ onyeisi ọrụ Onyeisiala na onye ọbụla ọzọ a kpọrọ aha kemgbe okwu ụlọọrụ adịgboroja a Adeyemi hiwere pụtara.
O kwuru na ọ bụrụ na e emeghị nnyocha zuruoke a, ọ pụtara na gọọmenti nakwa ezi ọchịchị akpụọla afọ n'ala na Naịjirịa.
Ihe ọzọ Ọkaiwu Ologun kwuru bụ na ọ dị mkpa ka e nye Adeyemi ohere ịgwa ọhanaeze okwu maka ọ dị mkpa ịnụ ihe o nwere ikwu banyere ebubo a na-ebo ya.



