Chukwuemeka Igwe: Eze udele na-agba mbọ ịkpọghachite udele ndị si Naịjirịa

Aha onyonyo, Chukwuemeka Igwe: Eze udele na-agba mbọ ịkpọghachite udele ndị si Naịjirịa
Chukwuemeka Igwe: Eze udele na-agba mbọ ịkpọghachite udele ndị si Naịjirịa
    • Onye dere ya, Makuochi Okafor
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Nwoke a na-alụ ọgụ ịchekwa udele.

Na Naịjirịa nakwa mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka, a na-ahụta udele dịka ihe ọjọọ.

Otu arụsị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na-eji usoro omenala echekwa udele kemgbe.

Mana ndị mbịarambịara amalitela igbu nnụnụ ndị a, ma na-ekpochapụ ha.

Ọnụọgụgụ udele adaala n'ike, oge ụfọdụ ha agwụla, nke mere ka ya na ndị na-echekwa ihe si na chi rụọ ọrụ ichekwa nnụnụ a.

Chukwuemeka na ndị na-echekwa ihe si na chi, na-achọpụta ọnụọgụgụ udele, gbasaa ozi ma soro ndị ndu ime obodo rụọ ọrụ ịchekwa nnụnụ a.

Ọ bụghị naanị ogbugbu a na-egbu udele mere ọnụọgụ ha ji ebelata n'ọdịda anyanwu Afrịka, e kwuru na nkwenye ndị so akapata ya.

Ndị ọrụ na-echekwa a kwuru na site n'ọrụ ha na ndị ime obodo, ha ahụla ụfọdụ mgbanwe n'ụfọdụ mpaghara Naịjirịa bụ ebe a akacha atụ mgbere udele.

Chukwuemeka Igwe gwara BBC na obodo ya bụ Awka Etiti anaghị eri udele maka na ndị nna ya mere ka ha mara na udele abụghị anụ.

"Anyị ji otu aka ahụ too. Ọ bụghị omenala. Ihe ọ bụ bụ ihe obodo na-asọ. Oge ahụ, ị ga-ahụ ka udele na-akpagharị. Oge mbụ, enweghị ihe na-anwụchi udele. Oge ha hụrụ na e nwere ihe e tinyere na-anwụchi ha, ha malitere ịgba ọsọ. Mana ụdịrị osisi a anyị nọ na ya ugbua, a mụbeghị onye ahụ ga-abịa rigoro n'elu ngụma sị na ọ chọrọ ị mara udele ọnyá n'ebe a. Maka na tupu o chepụta echiche irigoro ya, ngụma ga-adọgbu ya. Ọ bụ ya mere udele bịa ebe a, enwebeghi onye na-abịa ebe a enye ya nsogbu," ka ọ kọwara.