'Aba Women Riot malitere dịka esemokwu n'etiti Nwanyịrị na Okugo'

Aha onyonyo, Aba Women's Riot bidoro site n'esemokwu n'etiti mmadụ abụọ
'Aba Women Riot malitere dịka esemokwu n'etiti Nwanyịrị na Okugo'
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor (Onyenchịkọta ndị ntaakụkọ)
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Donald Chika Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Onye ntakụkọ na-ese ihe onyoonyo
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Ikechukwu Uzu-Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist BBC Igbo
    • Ebeg o si, Legọs
  • Mgbe e biputara ya

Ulọmgbasa ozi BBC mere njem gaa n'obodo Oloko dị n'okpuruọchịchị Ikwanọ dị n'Abịa steeti.

Anyị gara n'ụlọ Okugo, nwoke ndị Bekee họọrọ dịka Warrant Chief n'oge ahụ. Ọ bụ ọgaranya bara ụba ma nwee nkwanye ugwu ndị obodo ya.

N'ezinaụlọ Nwanyịrịụwa ndị obodo hụrụ n'anya. A sị na ọ na-asụnkwụ mgbe ndị ọrụ Okugo bịara pụrụ ya na ọ tụghị ụtụisi ndị Bekee manyere dịka iwu n'oge ahụ.

Kedụ ka esemokwu a si malite?

Akụkọ wee bụrụ na Nwanyịrịụwa na onye ọrụ Okugo nwere esemokwu maka ụtụisi ọ bịara za Nwanyịrịụwa, n'ọgụ nwanwa Okwugo bụ Ọkammụta Okugo, ọ gwara n'ekweghị ka anyị see ya onyoonyo maka na iwe ndị mba Briten ji ya, ọ sị anyị na Nwanyịrịụwa manyere onye ọrụ gọọmenti ahụ aka mmanụ nkwụ ka ha abụọ na-azọ nzọ, ọgụ wee daa.

Ọkammụta Okugo sị na Nwanyịrịụwa etiemkpu, yipu akwa ya gbaa n'ezi obodo, ụmụnwaanyị niile esooro ya gbakọọ.

Ndị ikwu Nwanyịrịụwa gwara BBC na ụmụnwaanyị gbakọrọ mgbe ahụ sị Enugwu, Aba, PọtAkọt, Ikom, Kalaba, Ogoni, ma na mpaghara mmalite anyanwụ Naịjirịa niile.

Ha sị na ụmụnwaanyị si obodo ndị ọzọ gbakọrọ ruru 800,000 ma karịa nde mmadụ gbakọrọ n'ihi Nwanyịrịụwa n'obodo Oloko.

Skip Akụkọ ọzọ gbasara Aba women Riot 1929 and continue readingAkụkọ ọzọ gbasara Aba women Riot 1929

End of Akụkọ ọzọ gbasara Aba women Riot 1929

Kedụ ka ụmụnwaanyị sị mee ngagharịiwe ha?

Chibunna Ojim bụ nwannadi Nwanyịrịụwa kọọrọ na ụmụnwaanyị ndị a wara osisi akọrọ na-esu ya n'ala ọ na-ada idim! Idim!

Mana n'akwụkwọ nlebaanya gọọmenti wepụtara n'oge ahụ, nke Komiti Aba Commission of Inquiry depụtara n'afọ 1930, ha kọwara na ụmụnwaanyị ndị ahụ gbara ara ha ọtọ wee gbochie njem site Novemba 1928 ruo Maachị 1929 n'ụzọ dị ichiche gụnyere Ịkọm, Kalaba, Aba, Ụmụahịa na Owere. Edemede a dị n'ụlọ ndowe akwụkwọ Rhodes House Library, n'Oxford, Lọndọn ugbua.

Etu ngagharịiwe a si mee ka ndị ọchịchị Briten agbanwee iwu Naịjirịa gbasara ụmụnwaanyị na ụtụisi

Mata na ọ bụ n'afọ 1928 ka ndị Bekee tinyere iwu ka ndị mmadụ bido tụwa ụtụisi. Mana ha tụgharịrị iwu a ka naanị ụmụnwaanyị na-arụrụ gọọmenti ka ha bụrụ naanị ndị ga-atụ ụtụisi.

Iwu a dịịrị ruo mgbe ndị Naịjirịa ewegharịa ọchịchị n'aka ndị Bekee n'afọ 1963, mgbe ndị ụlọomeiwu elebanyezie iwu ahụ anya ọzọ.

"Ọ bụ Oloko Riot ọ bụghị Aba Women Riot"

Maazị Monday Obadimma bụ onye ezinaụlọ nna Okugo kwuru na onye odeeakwụkwọ bụ onye gbanwere aha ngagharịiwe a ka ọ bụrụ Aba Women riot maka na ọ na-atụ ụjọ ka ndị Briten hapụ iji matra ya.