E liela ozu omee ihe nkiri ama ama bụ Olu Jacobs na Lagos

Mgbe e bu ozu Olu Jacobs aga n'ebe e lili ozu ya.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Anya mmiri na obi nwute ka ndị omee ihe nkiri ama ama, ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị, nakwa ndị nnukwu mmadụ dị iche iche ji gbakọọ na Lagos maka olili ozu onye omee ihe nkiri a ma ama na Nigeria, bụ Olu Jacobs.

E mere emume asọpụrụ ikpeazụ ya na Freedom Centre dị na Lekki, tupu a gaa lie ozu ya n'ebe lịlị ozu nke Ikoyi.

Ndị ezinụlọ ya kpebiri na emume olili ozu a, nke mere taa abalị abụọ n'ọnwa Ọktoba 2026, ga-abụ nke nzuzo, n'enweghị ohere ka ọha na eze sọnye na ya.

Olu Jacobs bụ otu n'ime ndị omee ihe nkiri kacha nwee aha n'ụlọọrụ Nollywood, ma bụrụkwa onye rụrụ nnukwu ọrụ n'ịkwalite ihe nkiri n'Afrịka na mba ndị ọzọ.

Ọ hapụrụ ụwa na Sepụtemba 2026 mgbe ọ gbara afọ 84.

Akpatị ozu Olu Jacobs

Foto ndị amaama bịara olili ozu Olu Jacobs

Ndị isi ọchịchị bịara ikwanyere Olu Jacobs ugwu ikpazu gụnyere osote gọvanọ Lagos steeti Lagos, bụ Obafemi Hamzat, nakwa onye bubụ gọvanọ Lagos Ogun steeti bụ Ibikunle Amosun.

Ndị ọzọ na-eme ihe nkiri a ma ama bịakwara n'emume ahụ bụ Tony Umez, Patrick Doyle, Keppy Ekpeyong, Morayo Afolabi-Brown, Ireti Doyle, Stan Nze, Kate Henshaw, Stephanie Okereke, Ernest Obi, nakwa OC Ukeje.

Tony Umez
Ndị na-eme ejije amaama Hilda Dokubo na Ebele Okaro
Onye bịara mgbaru.
Ndị bịara mgbaru

Ọtụtụ ihe e ji echete Olu Jacobs

  • A mụrụ Oludotun Baiyewun Jacobs n'ụbọchị 11 Julaị 1942.
  • Ọ natara ọzụzụ na Royal Academy of Dramatic Art tupu ọ malite njem ya si n'ụlọmgbasaozi mba Briten bụ British Television ruo n'ọtụtụ ejije a ma ama na mbaụwa.
  • O sonyere n'ejije karịrị otu narị (100) ma natakwa ọtụtụ nkwanyeugwu, nke gụnyere ọkibe n'ime ejije n'afọ 2007 bụ nke African Movie Academy Award nyere ya.
  • E nyekwara ya ihe nrite Member of the Order of the Federal Republic n'afọ 2011.
  • Ya na nwunye ya bụ Joke Silva jikọtara aka hiwe Lufodo Group na Lufodo Academy of Performing Arts.
  • N'ime afọ ole na ole ndị gara aga ka ọ malitere ịrịa ọrịa nchefu bụ 'lewy body dementia', bụ nke mere ka ọ kwụsị ime ejije.
  • E bugharịala ozi ụgha gbasara ọnwụ ya ugboro ugboro, ke gụnyere n'afọ 2021 na 2024, mana ezinaụlọ ya pụtara kwuo na ọ bụghị eziokwu.
  • Ndị dị ndụ na-eru uju ọnwụ ya gụnyere nwunye ya bụ Joke Silva, ụmụ ya, ụmụ ụmụ ya nakwa ọhanaeze ndị ihe ya na-amasị.
Olu Jacobs

Okwu ndị na-eme ihe nkiri Nollywood kwuru banyere ndụ na ọrụ Olu Jacobs

Ndị bịara emume ahụ gụnyere Richard Mofe-Damijo (RMD), Funke Akindele na ọtụtụ ndị ọzọ a ma ama n'ụlọọrụ ihe nkiri.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
WhatsApp BBC News Igbo nọ n'obaozi
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akaochie na-eme ihe nkiri bụ Jide Kosoko, kwuru na Olu Jacobs abụghị naanị ezigbo onye ejije, kama na ọ bụ "ụlọakwụkwọ" n'onwe ya na onye hụrụ Nigeria n'anya.

O kwuru na otu n'ime ihe a na-agaghị echefu banyere Olu Jacobs bụ mkpebi o mere ịhapụ ọrụ o rụrụ na mba ọzọ, ebe ọ nwetara nnukwu aha n'ihe nkiri, laghachi Nigeria iji nyere aka n'ịzụlite ụlọọrụ ihe nkiri.

Kosoko kwuru na nke a mere n'oge ọtụtụ ndị Nigeria na-achọ ịgafe mba ofesi.

Onye ejije ọzọ bụ Keppy Ekpeyoung kwuru na mgbe mmadụ nọnyere Olu Jacobs, ọ na-eme ka onye ahụ nwee mmetụta pụrụ iche.

O kwuru na Olu na-agba ndị mmadụ ume, na-enyere ha aka ime ihe nkiri.

Dịka ọ siri kwuo, Olu Jacobs bụ nwoke dị nwayọọ, mana olu ya na-ada 'dịka ọdụm' mgbe ọ na-ekwu okwu.

RMD kwuru na Olu Jacobs kụziiri ya ọtụtụ ihe gbasara ọrụ ejije, gụnyere mkpa ọ dị ịnọ na nkwadebe oge niile mgbe a na-eme ihe nkiri.

O kwuru na Olu na-akụzikarị ihe site n'akụkọ na ahụmịhe ndụ ya.

Onye ejije ọzọ, Funke Akindele kọwara Olu Jacobs dịka nwoke hụrụ ndị mmadụ n'anya, onye na-atọ ụtọ ịnọnyere na "nna" nye ọtụtụ ndị nọ n'ụlọọrụ ahụ.

O kwuru na otu n'ime ihe ndị ọ mụtara n'aka ya bụ ịdị umeala n'obi na ịrụsi ọrụ ike.

Onye ejije, Oyetoro Hafeez kpughere na Olu Jacobs nyeere ya aka ịnagide nsogbu ikwu okwu nke ọ na-enwe.

O kwuru na ya bụ onye na-asụ nsụ, mana ọtụtụ ndị anaghị ama nke a n'ihi ihe Olu Jacobs kụziiri ya mgbe ọ malitere ime ihe nkiri na Asaba.