Enweghị ejije ọbụla nwereike ikewa mụ na di m - Linda Ejiofor-Suleiman

Aha onyonyo, Enweghị ejije ọbụla nwereike ikewa mụ na di m - Linda Ejiofor-Suleiman
Enweghị ejije ọbụla nwereike ikewa mụ na di m - Linda Ejiofor-Suleiman
    • Onye dere ya, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Donald Wogu na Chinonso Nnachi
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalist
  • Mgbe e biputara ya

Linda Ihuoma Ejiofor-Suleiman agwala BBC News Igbo etu ya na di ya bụ Ibrahim Suleiman si nwee nghọta dịka di na nwunye na-eme ejije a ma ama.

Na mkparịtaụka Linda Ejiofor na BBC News Igbo nwere, o kwuru na dị ya na-enye ya ezi nkwado ma kọwaa na ya na di ya na-enwe mkparịtaụka tupu ha eme ejije ọbụla.

O kwuru na ọ bụ ezi nkwado na nghọta ya na dị ya nwere bụ ihe mere alụmdi na nwunye ha abụọ ji kwụdosie ike taa.

"Ihe dị mkpa bụ ịlụ di maọbụ nwunye ga-akwado gị oge niile ma na-enyere gị aka n'ihe ị na-eme".

O kwuru na ọ dị mkpa ka nwoke ọbụla na-eme nwunye ya obi ụtọ maka na ọ bụ nke a na-eme ka udo dịrị n'ezinaụlọ.

Banyere oyinye AMVCA abụọ o ritere, Linda gwara anyị na ya gbara mbọ n'ejije abụọ ahụ e ji maka ya nye ya onyinye ahụ.

N'okwu ya "ọ bụghị ihe ịtụ n'anya nye m oge m nwetere ozi banyere nhọpụta a họpụtara m maka ejije abụọ ahụ bụ 'The Herd' na 'The Serpents Gift'. Tupu e mee emume AMVCA ahụ, agwara m di m na obi ga-adị m ụtọ ma ọ bụrụ na m nweta otu onyinye nrite AMVCA ahụ maka na agbalaa m mbọ.

Ọ kọwaara anyị etu njem ya dịka onye na-eme ejije si malite nakwa ihe ọ na-atụ anya ime n'afọ ise maọbụ iri na-abịa.