Nnamdi Kanu agbaala gọọmentị akwụkwọ sị ka a kwụọ ya ego iti aka n'obi maka 'njide iwu na-akwadoghị'

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu,agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe iji rịọ ụlọikpe ka ọ manye Gọọmenti Etiti ka ha kwụọ ya ụgwọ ma rịọ ya mgbaghara maka "njide iwu na-akwadoghị".

Kanu mere arịrịọ a n'akwukwo ikpe bu akara CV/5142/24 nke gbara n'ihu ọkaikpe O.A. Ebong nke Ụlọikpe Ukwu dị na Abuja.

N'akwụkwọ arịrịọ ya, Kanu na-agbagha njide e jidere ya n'etiti ụbọchị 13 na 28 nke Ọktoba n'afọ 2022 Ọ rịọkwara ka ụlọikpe kwupụta na njide ahụ megidere iwu ma nye ya ụgwọ mmebi.

Mana ndị ọkaiwu gọọmenti etiti rịọrọ ụlọikpe ka ọ tụfuo okwu ahụ, na-ekwu na ikpe ahụ enweghịzi isi n'ihi na e mechaala maa Kanu ikpe.

Ha kwuru na Kanu etinyela akwụkwọ mkpesa n'Ụlọikpe Mkpegharị na-agbagha ikpe ahụ, ebe gọọmenti etiti site n'ụlọọrụ ọkaiwu Gọọmentị etiti Naijirịa, tinyekwara akwụkwọ na-arịọ ka a gbanwee ntaramahụhụ ndụ e nyere ya ka ọ bụrụ ikpe ọnwụ.

Dị ka ndị ọkaiwu gọọmenti si kwuo, ebe okwu ndị a ka dị n'ihu Ụlọikpe Mkpegharị, ọ gaghị adị mma ka ụlọikpe kpee mkpebi gbasara arịrịọ Kanu.

Mana ọkaiwu Kanu bu Nnaemeka Ejiofor, jụrụ arụmụka ahụ. O kwuru na Nkeji 46(1) nke Iwu Ọchịchị 1999 na-enye nwa amaala ọ bụla ikike ịga ụlọikpe ma ọ bụrụ na e mebiri ikike mmadụ ya.

Ejiofor kwuru na ihe kpatara arịrịọ ahụ mere n'etiti 13 na 28 Ọktoba afọ 2022, tupu e maa Kanu ikpe.

Ọ gbara ụlọikpe ume ka ọ kọwaa iwu n'ụzọ ga-eme ka ikike ụmụ Naịjirịa mụbaa, ọ bụghị n'ụzọ ga-ebelata ha.

Ọ sịrị na ikpe e mechara maa Kanu, nke ka nọkwa n'ụlọikpe mkpesa, enweghị ike ihichapụ mmebi ikike ọ na-ekwu na e mere ya tupu ikpe ahụ.

Mgbe ọ nụrụ arụmụka sitere n'akụkụ abụọ ahụ, Ọkaikpe Ebong yigharịrị ikpe ahụ ruo ụbọchị 30 Juun afọ 2026 maka ịga n'ihu n'ịtụle ya.