Kemgbe m bụ nwata ka m nwere mmasị ịbụ onye na-eme ejije - Real Judy
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Orji Nnachi
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Anthony Okwudei
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Real Judy, onye ezigbo aha ya bụ Judith Obasi ekwuola na ya malitere inwe mmasị ime ejije oge ọ ka bụ nwata.
Na mkparịtaụka pụrụiche Real Judy na BBC News Igbo nwere, ọ kọwara na ya bụ onye Ọlụ dị n'Imo Steeti mana a mụrụ ya na Legọs Steeti.
"Agara m akwụkwọ n'Ogun Steeti. Agụrụ m JSS 1 na JSS 2 n'Imo Steeti n'ụlọakwụkwọ Logos dị n'Awọ Ọmamma. Tupu m gaa Ogun Steeti gụọ JSS 3 ruo SS 3. Agara m mahadum na UNILAG," ka ọ gwara anyị.
Ọ gara n'ihu kwuo na onye niile maara ya nke ọma dịka onye nwere ezigbo isiike oge ọ na-etolite, nke mere na ọ gaghị atụ onye ọbụla n'anya na ha na-ahụ ya na soshal midịa ugbua.
Real Judy kwukwara na ya bụ onye na-echepụta ihe ọhụrụ. Ọ sị na ọ na-amasị ya ịchị ọchị nakwa ime ka ndị ọzọ na-achị ọchị.
Judith Obasi kọwara na ya bụ onye na-enwe mmasị ịnọọrọ onwe ya n'ime ụlọ n'ihi ụdị ọzụzụ o nwetara n'aka nne ya oge ọ na-eto eto, mana ọ na-amasịkwa ya ịpụ apụ.
"O nwere ihe a na-akpọ 'ambivert', ọ bụ ihe m bụ. Ana m anọọrọ onwe m ma na-apụkwa apụ, mana ọ na-amasị m ịpụ ịpụ. Achọrọ m ịbụ onye na-apụ apụ. Ana m achọ ya mana ọ naghị ekwe m n'ihi ọzụzụ nne m nyere m. Anyị dị naanị ụmụ nwaanyị anọ. Oge niile anyị nọ n'ime ụlọ."
Real Judy mekwara ka anyị mata ihe kpaliri mmụọ ya ịmalite ụdịrị ihe nkiri dị iche iche ọ na-eme na soshal midịa.
Dịka o siri kwuo, "ihe nkiri 'Ajoke na Chikodi' bụ ihe na-emekarị ebe ọtụtụ mmadụ bi n'otu mbaraezi a kpọrọ 'face me, I face you'. Ị ma, n'ime mbaraezi dị etu ahụ, ma ndị Igbo ma ndị Yoruba na-ebikọta ọnụ. Ha na-esekarị okwu. M sịzie ebe ọ bụ na o nwebeghị onye malitere ime ihe nkiri dị etu ahụ, ka m mewe ya ma na-egosipụta ya n'ọbaozi m. Abụ m onye na-asụ asụsụ Yoroba maka na a mụrụ m n'Eko. Amakwa m asụ Igbo, ya mere enwere m ike ịkpa agwa abụọ ahụ."
Nwaada Obasi kwuru na ụmụnwaanyị ndị na-eme ihe nkiri na Naịjirịa ebughị ibu, nke mere na ha anaghị enweta ụdịrị ohere ndị nke nwoke na-enweta.
"Ihe m chọrọ ịbụ na mmalite bụ omee ejije mana m gwa ndị mmadụ gbasara ya, ha asị m na ọ dịghị mfe. Na tupu m hụ onye nhazi ejije maọbụ ihe ndị ọzọ dị n'ime ya, oge agaala. M sịzie ka m jiri ihe nkiri malite, ka ha jiri ya hụ ihe m nwereike ime."
Real Judy kwuru na ya bụ onye na-ahazi emume a kpọro MC na mkpirisi Bekee, ma bụrụkwa onye ọrụ mgbasaozi.
"Amalitere m ịgbasaozi na StarTimes. O nwere ihe omume m na-emebu na StarTimes," ka ọ kọọrọ BBC News Igbo.
Real judy kwuru na ya na-ahụ onwe ya dịka onye na-eme ejije a ama ama na Naịjirịa, na mba ofesi nakwa na mbaụwa n'ime afọ ise na-abịa abịa.



