Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị Inec gbasara ndebanyeaha
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Adline Okere
- Ndị mere akụkọ a, Editor
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Oluwadara Onipede
- Ndị mere akụkọ a, Studio Engineer
- Mgbe e biputara ya
Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ekwupụtala njikere ha dị maka ntuliaka nke afọ 2027.
Osote Onyeisi Mgbasaozi n'ụzọ ọgbara ọhụrụ n'ụlọọrụ Inec bụ Ijeoma Okoye kwuru nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche.
Okoye kwuru na ụlọọrụ Inec na-agbasị mbọ ike iji hụ na ntụliaka afọ 2027 gara nke ọma ma bụrụkwa nke a ga-atụkwasị obi.
Dịka o siri kwuo, otu ụzọ Inec chọrọ iji mezuo nke a bụ site n'ịga n'ihu n'ihe omume ndebanyeaha maka ndị ga-atụ vootu.
Ijeoma Okoye kwuru na ihe omume ndebanyeaha nke ugbua bụ nke ugboro atọ nakwa nke ikpeazụ a ga-eme tupu ntuliaka afọ 2027.
Ọ kọwara na ihe omume a ga-akụrụ ọnụ n'ụbọchị 26 Julaị 2026.
Okoye kwuru na ihe omume a bụ maka ndị chọrọ idebanye aha ọhụrụ, ndị akwụkwọ ntuliaka PVC ha furu efu, ndị chọrọ ịgbanwe ogige ntuliaka ha maọbụ ndị chọrọ ịhazi njirimara ha.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị iwu na onye ọbụla chọrọ idebanye aha ga-agarịrị n'ụlọọrụ Inec, kama ha nwereike iji ekwentị maọbụ akụrụngwa ọbụla ji ịntaneetị arụ ọrụ debanye aha ha.
Okoye mere ka o doo anya na ọ gwụchaala PVC bụ ikike nwaafọ Naịjirịa ọbụla ruru afọ iri na asatọ (18) nwere iji binye aka n'oge ntuliaka.



